Abù Ọma
Abụ Ọma 96
Bùkuenu Jehova abù ọhu:
Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile.
2 Bùkuenu Jehova abù, gọzienu aha-Ya;
Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.
3 Kọsanu akukọ ebube-Ya n'etiti mba nile,
Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.
4 N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku:
Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu n'elu chi nile.
5 N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu:
Ma Jehova mere elu-igwe.
6 Ebube na ima-nma di n'iru Ya:
Ike na nma di n'ebe nsọ Ya.
7 Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche,
Nyenu Jehova nsọpuru na ike.
8 Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya:
Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bata n'ogige-Ya nile.
9 Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ:
Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile.
10 Sinu n'etiti mba nile, Jehova bu eze:
Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya:
Ọ gēkpe ndi nile di iche iche ikpe n'izi-ezi.
11 Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù;
Ka oké osimiri bib͕o, ya na ùjú-ya;
12 Ka ọhia ṅuria ọṅu-agha, ya na ihe nile nke di nime ya;
Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù;
13 N'iru Jehova, n'ihi na Ọ biawo;
N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe:
Ọ gēji ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe,
Ọ gēji kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Ya kpe ndi nile di iche iche ikpe.