Abù Ọma
Abụ Ọma 66
Tikusienu Chineke nkpu ọǹù ike, uwa nile:
2 Bùanu nsọpuru aha-Ya n'abù ọma:
Menu ka otuto-Ya di nsọpuru.
3 Sinu Chineke, Le ka ọlu-Gi nile si di oké egwu!
N'uba nke ike-Gi ndi-iro-Gi gērube isi aghugho n'okpuru Gi.
4 Uwa nile gākpọ isi ala nye Gi,
Bùku kwa Gi abù ọma;
Ha gābùku aha-Gi abù ọma.
Selah
5 Jenu, hu ọlu nile nke Chineke;
Onye di egwu ka Ọ bu n'omume-Ya n'ebe umu madu nọ.
6 Ọ b͕anwere oké osimiri ka ọ ghọ ala-akọrọ:
Ha nāgabiga osimirí n'ukwu-ha:
Ka ayi ṅuria nime Ya n'ebe ahu.
7 O ji idi-ike-Ya achi rue mb͕e ebighi-ebi;
Anya-Ya abua nēche mba nile nche:
Ka ndi nēwezuga onwe-ha ghara ibuli onwe-ha elu.
Selah
8 Gọzienu Chineke-ayi, unu ndi nile di iche iche,
Me-kwa-nu ka anu olu otuto-Ya:
9 Onye na-etinye nkpuru-obi-ayi nime ndu,
Ọ kweghi kwa ka ewezuga ukwu-ayi n'ọnọdu-ha.
10 N'ihi na I nwawo ayi, Chineke:
I nuchawo ayi, dika esi anucha ọla-ọcha.
11 I mere ka ayi ma n'ọnyà;
I tukwasiwo n'úkwù-ayi ibu nānyib͕u ayi.
12 I mewo ka madu rikwasi inyinya gabiga n'elu isi-ayi;
Ayi bàra n'ọku na nime miri;
I we me ka ayi puta ba n'inwebiga-ihe-ókè.
13 M'gēji ọtutu àjà-nsure-ọku ba n'ulo-Gi,
M'gākwughachi Gi nkwam nile m'kwere Gi,
14 Nke eb͕ub͕ere-ọnum abua ji saghepu,
Nke ọnum kwu-kwa-ra, mb͕e nkpà dirim.
15 Ọtutu àjà-nsure-ọku, bú anu nwere abuba, ka m'gēsurere Gi,
Ha na ihe-nsure-ọku nke nēsì ísì utọ nke ebulu;
M'gāchu oke-ehi n'àjà, ha na nkpi.
Selah
16 Bianu, nuru, unu nile ndi nātu egwu Chineke,
M'gākọ kwa akukọ bayere ihe O meworo nkpuru-obim.
17 Ya ka m'jiri ọnum kpọkue,
Nbuli-elu di kwa n'okpuru irem.
18 Ọ buru na ọ bu ajọ ihe ka m'leworo anya nime obim,
Onye-nwe-ayi agaghi-anu olum:
19 N'ezie Chineke anuwo olum;
Ọ ṅawo nti olu ekerem.
20 Onye agọziri agọzi ka Chineke bu,
Onye nēwezugaghi ekperem, O sighi kwa n'ebe m'no wezuga ebere-Ya.