Abù Ọma
Abụ Ọma 118
Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
2 Biko, ka Israel si,
Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
3 Biko, ka ulo Eron si,
Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
4 Biko, ka ndi nātu egwu Jehova si,
Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
5 M'siri na nkpàm kpọkue Ja;
Ja zaram, me ka m'nọdu n'ebe sara mbara.
6 Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu:
Gini ka madu gēmem?
7 Jehova dirim n'etiti ndi nēyerem aka:
Mu onwem gēlekwasi kwa ndi nākpọm asì.
8 Ọ di nma ib͕abà nime Jehova
Kari itukwasi madu obi.
9 Ọ di nma ib͕abà nime Jehova
Kari itukwasi ndi amara aha-ha obi.
10 Mba nile ab͕awom buruburu:
N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.
11 Ha ab͕awom buruburu; e, ha ab͕awom buruburu:
N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.
12 Ha ab͕awom buruburu dika aṅu; emenyuwo ha dika ọku ogwu:
N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.
13 I nudawom enuda ka m'we da:
Ma Jehova yerem aka.
14 Ikem na abù ọmam ka Ja bu:
Ọ ghọwo-kwa-ram nzọputa.
15 Olu nke iti-nkpu-ọṅù na nzọputa di n'ulo-ikwū nile nke ndi ezi-omume:
Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.
16 Ebuliwo aka-nri Jehova elu:
Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.
17 M'gaghi-anwu, kama m'gādi ndu,
M'gākọ kwa akukọ ọlu nile nke Ja.
18 Ja adọwom aka na nti nke-uku:
Ma ọ bughi n'aka ọnwu ka O nyeworom.
19 Megherenum ọnu-uzọ-ama nile nke ezi omume:
M'gābà nime ha, m'gēkele Ja.
20 Nka bu ọnu-uzọ-ama Jehova nwere;
Ndi ezi omume gābà nime ya.
21 M'gēkele Gi, n'ihi na I zawom,
I we ghọrọm nzọputa.
22 Nkume nke ndi nēwu ulo juru
Aghọwo isi nkuku ulo.
23 Ọ bu n'aka Jehova ka nka sitere;
Nke ahu bu oké ọlu n'anya-ayi.
24 Nka bu ubọchi Jehova meworo;
Ayi gētegari egwú ọṅù, ṅuri kwa ọṅu nime ya.
25 Biko, Jehova, zọputa, biko:
Biko, Jehova, me ka ihe nāgara ayi nke-ọma, biko.
26 Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Jehova:
Ayi esiwo n'ulo Jehova gọzie unu.
27 Chineke ka Jehova bu, Ọ nyewo kwa ayi ìhè:
Chiri udọ̀ ke àjà-ememe, durue ya na mpi nile nke ebe-ichu-àjà.
28 Chinekem ka I bu, m'gēkele kwa Gi:
Chinekem ka I bu, m'gēbuli Gi elu.
29 Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.