Abụ Ọma 35

Jehova, luso ha ọ̀gù, bú ndi nālusom ọ̀gù: Buso ha agha, bú ndi nēbusom agha.
2 Jide ọta na ọta uku, Bilie iyerem aka.
3 Seputa kwa ube na anyu-ike-agha izute ndi nāchum: Si nkpuru-obim, Nzọputa-gi ka M'bu.
4 Ka ihere me ha, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, bú ndi nāchọsi nkpuru-obim ike: Ka ha b͕aghachi azu nwe iru-ihere, bú ndi nēchè ihe ọjọ ha gēmem.
5 Ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka n'iru ifufe, Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nēnupu ha.
6 Ka uzọ-ha b͕a ọchichiri, ka ọ buru kwa ebe nālo nālọ, Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nāchu ha.
7 N'ihi na ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha zoberem olùlù nke ub͕u-ha, Ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha gwuru olùlù nye nkpuru-obim.
8 Ka ntikpọ biakwasi ya mb͕e ọ nāmaghi; Ọzọ, ka ub͕u-ya nke o zobeworo jide ya onwe-ya: Nime ntikpọ ahu, ya dabà nime ya.
9 Nkpuru-obim gēteghari kwa egwú ọṅù na Jehova: Obi gātọ ya utọ na nzọputa-Ya.
10 Ọkpukpum nile gāsi, Jehova, ònye di ka Gi? Gi Onye nānaputa onye ewedara n'ala n'aka onye di ike kari ya, I nānaputa onye ewedara n'ala na ob͕eye n'aka onye nānapu ya ihe n'ike.
11 Ndi-àmà nke ihe-ike nēbili; Ihe nke m'nāmaghi ka ha nājum.
12 Ha nākwughachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe, Nkpuru-obim di ka onye b͕a aka nwa.
13 Ma mu onwem, mb͕e ha nāri ọria, uwem bu ákwà-nkpe: Ewedaram nkpuru-obim n'ala site n'obubu-ọnu; Ekperem nālaghachikute kwa obim.
14 Dika agasi na ọ burum eyì, dika agāsi na ọ burum nwa-nne, otú a ka m'jeghariri: Dika onye nēru újú nne-ya, otú a ka m'rudara n'ala nēyi uwe-nkpe.
15 Ma mb͕e m'nāru ukwu ha ṅuriri ọṅu, chikọta onwe-ha: Ha chikọtara onwe-ha imegidem, nētib͕um mb͕e m'nāmaghi; Ha dọkaram, ha eguzoghi kwa du:
16 Dika ndi emeruru emeru n'etiti ndi nāchì ọchì n'ihi ob͕e-achicha, Otú a ka ha takwasirim ikekere-ezé.
17 Onye-nwe-ayi, #mb͕e ole ka I ganēle anya? Si na ntikpọ nile ha weghachi nkpuru-obim, Si n'aka umu-ọdum weghachi nkpuru-obi m'nwere nání ya.
18 M'gēkele Gi n'etiti nkpọkọta bara uba: N'etiti otù ndi nwere ume ka m'gēto Gi.
19 Ekwela ka ndi-irom, bú ndi-okwu-ugha, ṅuam ọǹu: Ekwela ka ndi nākpọm asì mb͕e m'nēmeghi ihe b͕ue iku-anya.
20 N'ihi na ọ bughi okwu udo ka ha nēkwu: Ma ha nēchèputa okwu di iche iche nke aghughọ nile imegide ndi nọ jū n'ala.
21 Ha we me ka ọnu-ha sa mbara imegidem; Ha siri, Ehe, ehe, anya-ayi ahuwo ya.
22 I huwo ya, Jehova; ab͕ala nkiti: Onye-nwe-ayi, anọlam n'ebe di anya.
23 Kpọte Onwe-gi, kpetara ikpe m, Chinekem na Onye-nwem, tetara okwu-ikpem.
24 Kpem ikpe dika ezi omume-Gi si di, Jehova, bú Chinekem; Ekwe-kwa-la ka ha ǹuam ọǹu.
25 Ekwela ka ha si n'obi-ha, Ehe, nka bu ọchichọ nkpuru-obi-ayi: Ekwela ka ha si, Ayi elodawo ya.
26 Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, bú ndi na-aṅuri ọǹu n'ihe ọjọ nādakwasim: Ka ha yiri ihere na ọnọdu-ihere dika uwe, bú ndi nēme onwe-ha ka ha di uku imegidem.
27 Ka ha tie nkpu ọṅù, ṅuri kwa ọṅu, bú ndi ezi omumem nātọ utọ: Ka ha nāsi kwa mb͕e nile, Jehova di uku, Onye udo orù-Ya nātọ Ya utọ.
28 Irem ganēkwu okwu, dika onye nātughari uche, bayere ezi omume-Gi, Baye-kwa-ra otuto-Gi ogologo ubọchi nile.