Abù Ọma
Abụ Ọma 16
Debem, Chineke: n'ihi na ab͕abàwom nime Gi.
2 Asiwom Jehova, Onye-nwem ka I bu:
Ọdi-nmam adighi-eru Gi aru.
3 Asiwokwam ndi nsọ ndi nọ n'uwa,
Na ndi di ebube nke ọ bu nání ihe-ha nātọm utọ:
4 Ihe-nb͕u-ha gāba uba, bú ndi were chi ọzọ n'ọnọdu Jehova:
M'gaghi-awusi àjà-ihe-ọṅuṅu-ha nke ọbara,
M'gaghi-eburu kwa aha-ha n'elu eb͕ub͕ere-ọnum.
5 Jehova bu òkè nke ihe m'ketara na ìkom:
Gi onwe-gi nējide ihe rurum n'ife-nzà.
6 Udọ̀-ọtùtù nile adaworom n'ebe di utọ;
N'ezie ihe-nketam dim ezi nma.
7 M'gāgọzi Jehova, Onye duworom ọdu:
Ọzọ, akurum abua nādọm aka na nti n'abali nile.
8 Edowom Jehova n'irum mb͕e nile:
N'hi na Ọ nọ n'aka-nrim, agaghi-ewzugam n'ọnọdum.
9 N'ihi nka obim aṅuriwo ọṅu, nsọpurum eteghariwo kwa egwú ọṅù:
Ọzọ anu-arum gēbi na ntukwasi-obi.
10 N'ihi na I gaghi-arapuru ala-mọ nkpuru-obim;
I gaghi-enye onye-ebere-Gi ka ọ hu nbibi.
11 I gēme ka m'mara uzọ ndu:
Ojuju-afọ ọṅù di n'iru Gi;
E! utọ di iche iche di n'aka-nri-Gi ebighi-ebi.