Abụ Ọma 31

Nime Gi, Jehova, ka m'b͕abàworo; ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi: N'ezi omume-gi me ka m'b͕apu.
2 Tọrọm nti-Gi n'ala; naputam ngwa ngwa: Ghọrọm oké nkume nke ebe siri ike, bú ulo nke ebe ewusiri ike nke-uku izọputam.
3 N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu; Ọzọ, n'ihi aha-Gi I gēdum, dukwam nwayo.
4 I gēme ka m'si n'ub͕u nke ha zoberem puta; N'ihi na Gi onwe-gi bu ebem siri ike.
5 N'aka-Gi ka m'nēnye mọm idebe: I b͕aputawom, Jehova, Chineke nke ezi-okwu.
6 Akpọwom ha asì, bú ndi nāriba ihe-efu nile nke nābughi ihe ama: Ma mu onwem atukwasiwo obi na Jehova.
7 Ka m'tegharia egwú ọṅu, ṅuri kwa ọṅu, n'ebere-Gi: N'ihi na I huwo nweda-n'alam; I mawo nkpuru-obim n'ahuhu di iche iche:
8 I mechibidoghkwam nye n'aka onye-iro; I mewo ka ukwum abua guzo n'ebe sara mbara.
9 Merem amara, Jehova, n'ihi na anọm na nkpab͕u: Anyam emebiwo nime nkpasu-iwem, ya na nkpuru-obim, na afọm, dika uwe nla mebiri.
10 N'ihi na ndum agwusiwo n'iru-újú, na arọm nile n'ize-ume: Ikem asuwo ngọngọ site n'ajọ omumem, ọkpukpum nile emebiwo kwa, dika uwe nla mebiri.
11 N'ihi ndi-nkpab͕um nile aghọwom ihe-ita-uta nke-uku, Ọbuná n'ebe ndi-ab͕ata-obim nọ aghọwo-kwa-ram ndi m'mara oké egwu: Ndi nāhum n'èzí ab͕anariwom.
12 Echezọwo mu onwem dika onye nwuru anwu puru n'obi madu: Aghọwom ihe nāla n'iyì.
13 N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, Ujọ dim buruburu: Mb͕e ha nāb͕a ìzù n'otù imegidem, Ha zubere iwepu ndum.
14 Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tukwasiworo obi, Jehova: Asiwom, Chinekem ka I bu.
15 N'aka-Gi ka mb͕em nile di: Naputam n'aka ndi-irom, na n'aka ndi nēsob͕um.
16 Me ka iru-Gi nye orù-gi ìhè: Zọputam n'ihi ebere-Gi.
17 Jehova, ekwela ka ihere mem; n'ihi na akpọkuwom I: Ka ihere me ndi nēmebi iwu, ka ha debe ọnu-ha du n'ala-mọ.
18 Ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha da ob͕i; Nke nēkwu oké okwu megide onye ezi omume, Nime npako na nleda-anya.
19 Le ka ezi ihe-Gi si ba uba, nke I tukọbaworo nye ndi nātu egwu Gi, Nke I luworo nye ndi nāb͕abà nime Gi n'iru umu madu!
20 I nēzobe ha n'ebe-nzuzo nke iru-Gi ka ha pua n'aka nkekọta nile nke madu: I nēdebe ha na nzuzo n'ulo-ntu ka ha pua n'ise-okwu nke ire di iche iche.
21 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu: N'ihi na O mewo ka ebere-Ya di ebube n'ebe m'nọ n'obodo ewusiri ike.
22 Ma mu onwem, asirim na nkujam, Ebipuwom n'anya-Gi: Otú ọ di, I nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi.
23 Hunu Jehova n'anya, ndi-ebere-Ya nile: Ọ bu ndi kwesiri ntukwasi-obi ka Jehova nēchezi, Ọ nākwughachibiga kwa onye nēme omume npako ókè.
24 Dinu ike, ka obi-unu nwe kwa ume, Unu nile ndi nēchere Jehova.