Abụ Ọma 146

Tonu Ja. Nkpuru-obim, to Jehova.
2 M'gēto Jehova n'ogologo ndum nile: M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu.
3 Unu atukwasila obi n'aru ndi amara aha-ha, Ma-ọbu n'aru nwa nke madu, onye ọ nādighi nzọputa o nwere.
4 Mọ-ya nāpu apu, o we laghachi n'ala o si puta; N'ubọchi ahu èchìchè-ya nile alawo n'iyì.
5 Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ahu bu nke Chineke nke Jekob bu Onye nēyere ya aka, Nke olile-anya-ya dikwasi Jehova, bú Chineke-ya:
6 Onye meworo elu-igwe na uwa, Na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha; Onye nēdebe ezi-okwu rue mb͕e ebighi-ebi:
7 Onye nēmere ndi anēmeb͕u ihe O kpere n'ikpe; Onye nēnye ndi agu nāgu nri: Jehova nātọpu ndi-nkpọrọ;
8 Jehova nēmeghe anya ndi-ìsì; Jehova nēkuli ndi nēruda n'ala; Jehova n'ahu ndi ezi omume n'anya;
9 Jehova nēdebe ndi ala ọzọ; Nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru ka Ọ nēme ka ha guzo ọtọ; Ma uzọ ndi nēmebi iwu ka Ọ nēme ka ọ b͕agọ ab͕agọ.
10 Jehova gābu eze rue mb͕e ebighi-ebi, Chineke-gi, Zaion, gābu eze rue ọb͕ọ nile. Tonu Ja.