Abù Ọma
Abụ Ọma 28
Gi, Jehova, ka m'nākpọku; Oké nkumem, echila nti n'ebe m'nọ: Ka I we ghara ib͕am nkiti, M'we yie ndi nārida n'olùlù.
2 Nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi, Mb͕e m'chiliri akam abua n'ebe ime-ime-ulo nke ebe nsọ Gi di.
3 Adọkpurulam tiyere ndi nēmebi iwu,Tiye-kwa-ra ndi nālu ajọ ihe; Ndi nāgwa madu-ibe-ha okwu udo, Ma ihe ọjọ di n'obi-ha.
4 Nye ha dika ọlu-ha si di, na dika ijọ-njọ nke nmeso nile ha si di: ye ha dika aka-ha si eme; Nyeghachi ha ihe ha mere.
5 N'ihi na ha adighi-aghọta ọlu nile nke Jehova, Na n'ihi na ha adighi-aghọta ihe aka-Ya abua meworo, Ọ gākwada ha, Ọ gaghi-ewulita ha elu dika ulo.
6 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, N'ihi na Ọ nuwo olu aririọ-amaram nile.
7 Jehova bu ikem na ọtam; Ya ka obim tukwasiworo obi, eyewo-kwa-ram aka: Obim we nāwuli elu n'ọṅù; M'gēsite kwa n'abùm kele Ya.
8 Jehova buru ya ike, Ebe siri ike nke nzọputa nke onye nke Ya etere manu ka Ọ bu.
9 Zọputa ndi-Gi, gozi kwa ihe-nketa-Gi: Nāzù kwa ha dika aturu, nēku kwa ha n'aka-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.