Abụ Ọma 83

Chineke, edebela ọnu-Gi du: Ab͕ala nkiti, anọ-kwa-la jū, Chineke.
2 N'ihi na, le, ndi-iro-Gi nāb͕a aghara: Ọzọ, ndi nākpọ Gi asì ebuliwo isi-ha.
3 Ọ bu imegide ndi-Gi ka ha nāb͕a ìzù aghughọ, Ha nāb͕a ìzù imegide ndi-Gi edebeworo na nzuzo.
4 Ha asiwo, Jenu, ka ayi zopu ha n'ibu mbe; Agaghi-echeta kwa aha Israel ọzọ.
5 N'ihi na ha ewerewo otù obi b͕arita ìzù; Ọ bu imegide Gi ka ha nāb͕a ndu:
6 Ulo-ikwū nile nke Edom na ndi Ishmael; Moab na ndi Haga;
7 Gebal, na Amon, na Amalek; Filistia, ya na ndi bi na Taia:
8 Asiria araparawo kwa n'aru ha; Ha aghọworo umu Lot ogwe aka. Selah
9 Me ha otú I mere Midian; Otú I mere Sisera, otú I mere Jebin nime miri-iyi Kaishon:
10 Ekpochapuru ha n'En-doa; Ha ghọro ǹsí eji mezi ala.
11 Me ndi-ha amara aha-ha ka ha di ka Oreb, na dika Zeeb; Me kwa ka ndi-isi-ha nile di ka Zeba na dika Zalmuna:
12 Ndi siri, Ka ayi nwetara onwe-ayi Ebe-obibi nile nke Chineke.
13 Chinekem, me ka ha di ka ihe nke ifufe nēfeghari buruburu, Dika ahihia n'iru ifufe.
14 Dika ọku nke nēré oke ọhia, Na dika ire-ọku nke nēme ka ugwu nile nwuru ọku;
15 Otú a were oké ifufe-Gi chua ha, Were kwa oké ikuku-Gi me ka ha ma jijiji.
16 Me ka nlelì che ha iru; Ka ha we chọ aha-Gi, Jehova.
17 Ka ihere me ha, ka ha ma kwa jijiji rue mb͕e ebighi-ebi; E, ka ha nwe iru-ihere, la n'iyì:
18 Ka ha we mara na Gi onwe-gi, Onye aha-Gi bu Jehova, nání Gi, Bu Onye kachasi ihe nile elu n'elu uwa nile.