Abụ Ọma 100

Tikusienu Johova nkpu ọṅù ike, uwa nile.
2 Werenu ọṅù fè Jehova òfùfè: Werenu iti-nkpu ọṅù bia n'iru Ya.
3 Maranu na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke: Ya onwe-ya emewo ayi, ọ bu kwa Ya nwe ayi; Ayi bu ndi-Ya, na ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-Ya.
4 Werenu ekele ba n'ọnu-uzọ-ama-Ya nile, Werenu otuto ba n'ogige-Ya nile: Kelenu Ya, gọzi-kwa-nu aha-Ya.
5 N'ihi na Jehova di nma; rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di; Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Ya di kwa.