Abụ Ọma 124

Asi na ọ bughi Jehova Nke diri ayi, Biko, ka Israel kwue otú a, si;
2 Asi na ọ bughi jehova Nke diri ayi, Mb͕e madu biliri imegide ayi:
3 Mb͕e ahu ha gēlowori ayi na ndu, Mb͕e iwe-ha di ọku n'aru ayi:
4 Mb͕e ahu miri gēruchapuwori ayi, Miri-iyi gāgabigawori n'elu nkpuru-obi-ayi.
5 Mb͕e ahu miri di nganga gāgabigawori n'elu nkpuru-obi-ayi.
6 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye nēnyeghi ayi iburu ezé-ha anu-ndọb͕u.
7 Nkpuru-obi-ayi ewepugawo onwe-ya dika nnunu n'ib͕udu ndi-osi-ọnyà: Ib͕udu ahu kpajiri akpaji, ayi onwe-ayi we wepuga onwe-ayi.
8 Iye-aka-ayi di n'aha Jehova, Onye meworo elu-igwe na uwa.