Abụ Ọma 55

Ge nti n'ekperem, Chineke; Ezonari-kwa-la Onwe-gi n'aririọ-amaram.
2 Ṅam nti, zam: Anamalù ulù na ntughari-obim, nāsu kwa oké ude;
3 N'ihi olu onye-iro, N'ihi nkpab͕u nke onye nēmebi iwu; N'ihi na ha nēme ka ajọ ihe me nkpatu megidem, Ọ bu kwa n'iwe ka ha nākpọm asì.
4 O nēb͕usi nkpuru-obim nb͕u ike nimem: Oké ujọ nile nke ọnwu adakwasiwo-kwam.
5 Egwu na ima-jijiji nābiarum aru, Oké ọma-jijiji ekpuchiwokwam.
6 M'we si, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem nkù dika nduru! M'gēfela, we nọdu du.
7 Le, m'gēferu ebe di anya, Nọ ọnọdu-abali n'ọzara. Selah
8 M'gēwere ọsọsọ si n'ifufe siri ike na n'oké ifufe Biarue ebe-nb͕apu dirim.
9 Onye-nwe-ayi, loda ha, kesa ire-ha: N'ihi na ahuwom ihe-ike na ilu-ọ̀gù n'obodo.
10 N'ehihie na abali ka ha nāb͕a ya buruburu n'elu mb͕idi-ya nile: Ma ajọ ihe ma nmeb͕u di n'etiti ya.
11 Ihe-ila-n'iyì di iche iche di n'etiti ya: Nzọb͕u na aghughọ adighi-esi kwa n'amá-ya nile.
12 N'ihi na ọ bughi onye-iro nātam uta; M'gānagide kwa ya: Ọ bughi onye nākpọm asì mere onwe-ya uku megidem; M'gēzonari kwa ya onwem:
13 Kama ọ bu gi onwe-gi, onye mu na gi ra, Eyìm, na onye m'mara nke-ọma.
14 Ayi nāb͕akọri ìzù utọ, N'ulo Chineke ka ayi nējeghari n'etiti ìgwè madu.
15 Ka ọnwu biakwasi ha na mberede, Ka ha ridarue ala-mọ na ndu: N'ihi na ihe ọjọ nile di n'ebe ha nọ dika ọbìa, n'etiti ha.
16 Ma mu onwem, Chineke ka m'gākpọku; Jehova gāzọputakwam.
17 Anyasi, na ututu, na etiti-ehihie, ka m'gātughari uche, su kwa oké ude: Ọ gānu kwa olum.
18 Ọ b͕aputawo nkpuru-obim me ka ọ ba n'udo, ka ha ghara ibiarum nso: N'ihi na ha bara uba, bú ndi mu na ha nālu ọ̀gù.
19 Chineke gānu olum, weda kwa ha n'ala, Bú Onye nānọdu ka eze site na mb͕e ochie. Selah Ha bu ndi nēnweghi nb͕anwe, Ha adighi-atu kwa egwu Chineke.
20 O setiwo aka-ya abua imegide ndi ya na ha nọ n'udo: O mewo ọb͕ub͕a-ndu-ya ka ọ ghara idi nsọ.
21 Ha bu okwu ire-utọ, bú okwu ọnu-ya nke di ka miri-ara raru araru, Ma nání agha ka obi-ya bu: Okwu-ya nile di nrò kari manu, Ma okwu ahu bu mma-agha amiputara amiputa.
22 Tukwasi Jehova ihe O nyeworo gi dika ibu, Ya onwe-ya gānagide kwa gi: Ọ gaghi-ekwe ka ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi
23 Ma Gi onwe-gi, Chineke, gēme ka ha rida n'olùlù nbibi: Ndi bu ndi-ọbara na ndi-aghughọ agaghi-adiru nkera ubọchi-ha; Ma mu onwem gātukwasi obi na Gi.