Abụ Ọma 85

Jehova, ihe ala-Gi atọwo Gi utọ: I mewo ndi Jekob adọtara n'agha ka ha lata.
2 I bupuwo ajọ omume ndi-Gi, I kpuchiwo nmehie-ha nile. Selah
3 I kpochapuwo nrubiga-ókè nke iwe-Gi: I siwo n'di-ọku nke iwe-Gi chighari Onwe-gi.
4 Me ka ayi lata, Chineke nke nzọputa-ayi, Me ka ọ gwusia, bú iwe ayi nākpasu Gi.
5 Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I ganēwesa ayi iwe? Ì gēme ka iwe-Gi digide rue ọb͕ọ nile?
6 Gì onwe-gi agaghi-eme ka ayi di kwa ndu ọzọ: Ka ndi-Gi we ṅuria nime Gi?
7 Jehova, me ka ayi hu ebere-Gi, Nye kwa ayi nzọputa-Gi.
8 M'gānu ihe Chineke, bú Jehova, gēkwu: N'ihi na Ọ gāgwa ndi-Ya, gwa kwa ndi-ebere-Ya, okwu udo: Ma ka ha ghara ilaghachi ba n'ihe-nzuzu.
9 Otú ọ di, nzọputa-Ya di nso ndi nātu egwu Ya; Ka nsọpuru we biri n'ala-ayi.
10 Ebere na ezi-okwu ezutewo; Ezi omume na udo esutuwo ọnu.
11 Ezi-okwu nēpú epú n'ala; Ezi omume esiwo kwa n'elu-igwe lepu anya.
12 Ọzọ, Jehova gēnye ezi ihe; Ala-ayi gēnye kwa ihe-ọmume-ya.
13 Ezi omume gāga n'iru Ya; Ọ gēme kwa ka nzọ-ukwu-Ya nile ghọ uzọ.