Abụ Ọma 33

Tienu nkpu ọṅù nime Jehova, unu ndi ezi omume: N'ebe ndi ziri ezi nọ otuto mara nma.
2 Werenu ubọ-akwara kele Jehova: Werenu une nke akwara iri bùkue Ya abù ọma.
3 Bùkueune Ya abù ọhu; Werenu iti-nkpu me ka ọkpukpọ-ubọ di nma.
4 N'ihi na okwu Jehova ziri ezi; Anālu kwa ọlu-Ya nile n'ikwesi-ntukwasi-obi.
5 Ọ nāhu ezi omume na ezi ikpé n'anya: Uwa juputara n'ebere jehova.
6 Okwu Jehova ka ejiri me elu-igwe; Eji-kwa-ra iku-ume nke ọnu-Ya me usu-ha nile.
7 Ọ nāchikọta miri oké osimiri dika obo-ihe: Ọ nētiye ob͕u-miri n'ulo-àkù di iche iche.
8 Ka uwa nile tua egwu Jehova: Ka ndi nile ndi bi n'elu-uwa dum madu bi tua ujọ Ya.
9 N'ihi na Ya onwe-ya kwuru okwu, o we di; Ya onwe-ya nyere iwu, o we guzo.
10 Jehova emebiwo ndum-ọdu mba nile: Ọ siwo èchìchè nile nke ndi di iche iche, É-è.
11 Ndum-ọdu Jehova nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi, Èchìchè nile nke obi-Ya rue ọb͕ọ nile.
12 Mba ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú mba ahu nke Jehova bu Chineke-ya; Bú ndi ahu Ọ rọputara iburu Ya ihe-nketa.
13 Jehova siri n'elu-igwe legide anya; Ọ huwo umu madu nile;
14 Ọ siwo n'ọnọdu ebe-obibi-Ya Lekwasi ndi nile bi n'uwa anya;
15 Bú Onye ahu Nke nākpu obi ha nile n'otù, Nke nāghọta kwa ọlu nile nke ha nile.
16 Ọ dighi eze anēji uba nke usu-ndi-agha-ya zọputa: Adighi-eji kwa ike riri nne naputa dike.
17 Nání ihe-nrafu ka inyinya bu iji zọputa madu: Ọ dighi-eji kwa ike-ya riri nne me ka madu wepuga onwe-ya.
18 Le, anya Jehova di n'aru ndi nātu egwu Ya, Bú n'aru ndi nēchere ebere-Ya;
19 Inaputa nkpuru-obi-ha n'ọnwu, Na idebe ha ndu n'oké unwu.
20 Nkpuru-obi-ayi echerewo Jehova: Iye-aka-ayi na ọta-ayi ka Ọ bu.
21 N'ihi na ọ bu nime Ya ka obi-ayi nāṅuri ọṅu, N'ihi na ọ bu aha nsọ Ya ka ayi tukwasiworo obi.
22 Jehova, ka ebere-Gi dikwasi ayi, Dika ayi chereworo Gi.