Abù Ọma
Abụ Ọma 6
Jehova, Abalaram nba n'iwe-Gi,
Adọ-kwa-lam aka na nti n'ọnuma-Gi.
2 Merem amara, Jehova; n'ihi na onye taworo aru ka m'bu:
Mem ka m'diri ndu, Jehova; n'ihi na ọkpukpum nile nāma jijiji.
3 Nkpuru-obim nāma kwa jijiji nke-uku:
Ma Gi onwe-gi, Jehova, rùe ole mb͕e?
4 Lata, Jehova, dọputa nkpuru-obim:
Zọputam n'ihi ebere-Gi.
5 N'ihi na ọ dighi ncheta-Gi di n'ọnwu:
Nime ala-mọ ònye gēkele Gi?
6 Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ize-umem;
Kwa-abali ka m'nēme ka ihe-ndinam se n'elu anya-mirim;
Ejim anya-mirim de ihe m'ji edina.
7 Anyam emebiwo site na nkpasu-iwem dika uwe nla mebiri;
Ọ kawo nká n'hi ndi-nkpab͕um nile.
8 Si n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu nile ndi nālu ajọ ihe;
N'ihi na Jehova anuwo olu ákwám.
9 Jehova anuwo arirọ-amaram;
Jehova gānara ekperem.
10 Ihere gēme ndi-irom nile, ha gāma kwa jijiji nke-uku:
Ha gālaghachi azu, ihere gēme ha na mberede.