Abụ Ọma 60

Chineke, I juwo ayi aju, I tiwawo ayi, I wewo iwe; I gēme ka ayi laghachi ọzọ.
2 I mewo ka ala ma jijiji; I b͕awawo ya: Mezie ntiwa-ya nile; n'ihi na o mewo nkpatu.
3 I mewo ka ndi-Gi hu ihe siri ike: I mewo ka ayi ṅua manya nke isu-ngọngọ.
4 I nyewo ndi nātu egwu Gi ọkọlọtọ, Ka ewe welie ya elu dika ọkọlọtọ n'ihi ezi-okwu. Selah
5 Ka ewe dọputa ndi I huru n'anya, Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi.
6 Chineke ekwuwo okwu n'di-nsọ-Ya; ka m'ṅuria ọṅu-agha: M'gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot.
7 Mu nwe Gilead, ọ bu kwa mu nwe Manase; Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim; Juda bu nkpa-n'aka-ezem.
8 Moab bu ite ọsisa-arum; N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum: Filistia, tie nkpu n'ihim.
9 Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike? Ònye duruworom rue Edom?
10 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke, juworo ayi aju? I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha ayi, Chineke.
11 Yere ayi aka ka ayi pua n'aka onye-nkpab͕u: N'ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu.
12 Nime Chineke ayi ga-eme ihe dìnkpà: Ọ bu kwa Ya onwe-ya gāzọda ndi nākpab͕u ayi