Abụ Ọma 95

Bianu, ka ayi tikue Jehova nkpu ọṅù: Ka ayi tikusie oké nkume nke nzọputa-ayi nkpu ọṅù ike.
2 Ka ayi were ekele bia n'iru Ya, Ka ayi were abù ọma tikusie Ya nkpu ọṅù ike.
3 N'ihi na Chineke uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa Eze uku nāchi chi nile.
4 Onye ebe nile nke michasiri emi nke uwa di n'aka-Ya: Ebe dichasi elu nke ugwu nile bu kwa nke Ya.
5 Onye nwere oké osimiri, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya; Ọ bu kwa aka-Ya kpuru ala-akọro.
6 Batanu, ka ayi kpọ isi ala ruru kwa ala; Ka ayi b͕ue ikperè n'ala n'iru Jehova Onye meworo ayi:
7 N'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi: Ayi onwe-ayi bu kwa ndi Ọ nāzù dika aturu, buru kwa ìgwè aturu nke aka-Ya. Ta, ọ buru na unu ege nti olu-ya,
8 Unu emela ka obi-unu sie ike, dika na Meriba, Dika n'ubọchi Masa n'ọzara:
9 Mb͕e nna-unu-hà nwaram, Nwaputam ìhè, hu kwa ọlum.
10 Ọgu arọ abua ka M'nāsọ ọb͕ọ ahu oyi, M'we si, Ndi nke nākpafu n'obi-ha ka ha bu, Ha onwe-ha amaghi kwa uzọm nile:
11 N'ihi ya aṅurum iyi n'iwem, si, Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli