Abụ Ọma 129

Ọtutu mb͕e ka ha kpab͕uworom site na mb͕e m'di na nwata, Biko, ka Israel kwue otú a, si,
2 Ọtutu mb͕e ka ha kpab͕uworom site na mb͕e m'di na nwata: Ma otú ọ di, ha apughi imegidem.
3 N'elu azum ka ndi-plough jiri plough gwu dika esi egwu ala-ubi; Ha mere ka furrow nile ha di ogologo.
4 Jehova bu onye ezi omume: O bipuwo udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu.
5 Ka ihere me ha, ka ha laghachi kwa azu, Bú ndi nile nākpọ Zaion asì.
6 Ka ha di ka ahihia nēpú n'elu ulo, Nke nākpọnwu mgbe o puputara:
7 Nke onye nēwe ihe-ubi nējighi kpojue ọbu-aka-ya, Onye nēhie ùkwù-ọka nējighi kwa ya kpojue obi-ya.
8 Ọzọ, ndi nāgabiga asighi, Ka ngọzi Jehova diri unu; Ayi agọziwo unu n'aha Jehova.