Abù Ọma
Abụ Ọma 37
Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ,
Ekwosola ndi nēme ajọ omume ekworo.
2 N'ihi na dika ahihia ka agēbipu ha ngwa ngwa,
Dika akwukwọ ahihia ndu ka ha gākpọnwu.
3 Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe;
Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi.
4 Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ;
Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ.
5 Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru;
Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya.
6 Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè,
Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie.
7 Nọ dū n'iru Jehova, were kwa ntachi-obi nēchere Ya:
Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi onye ọ nāgara nke-ọme n'uzọ ya,
N'ihi madu nke na-eme ajọ ihe-nzube di iche iche.
8 Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma:
Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n'ime ihe ọjọ.
9 N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ:
Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala.
10 Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa:
I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ.
11 Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala;
Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ.
12 Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume,
Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé.
13 Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì:
N'ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia
14 Ndi nēmebi iwu amiputawo mma-agha, zọ kwa uta-ha ukwu ikwe ya;
Ime ka onye ewedara n'ala na ob͕eye da,
Ib͕u ndi ziri ezi n'uzọ-ha:
15 Mma-agha-ha gābà n'obi onwe-ha,
Agāb͕aji kwa uta-ha.
16 Ihe ntà onye ezi omume nwere di nma
Kari ihe bara uba nke ọtutu ndi nēmebi iwu.
17 N'ihi na agāb͕aji ogwe-aka nke ndi nēmebi iwu:
Ma Jehova nākwagide ndi ezi omume.
18 Jehova mara ubọchi nile nke ndi zuru okè:
Ihe-nketa-ha gādiru kwa mb͕e ebighi-ebi.
19 Ihere agaghi-eme ha na mb͕e ihe ọjọ:
Afọ gēju kwa ha n'ubọchi oké unwu.
20 N'ihi na ndi nēmebi iwu gāla n'iyì,
Ndi-iro Jehova gādi ka ihe di oké ọnu-ahia nke umu-aturu:
Ha gēdè; n'anwuru-ọku ka ha gēdè.
21 Onye nēmebi iwu nēbiri ihe, ma ọ dighi-akwughachi:
Ma onye ezi omume nēme amara, nēnye kwa enye.
22 N'ihi na ndi Ọ nāgọzi gēnweta ala;
Ma agēbipu ndi Ọ nākọcha.
23 Site n'aka Jehova ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike;
Uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ.
24 Mb͕e ọ gada, agaghi-atudasi ya:
N'ihi na Jehova nākwagide aka-ya.
25 Nwata ka m'buworo, aghọwokwam okenye;
Ma ahughm onye ezi omume ka arapuru ya,
Ahughkwam nkpuru-ya ka ha nāriọ nri.
26 Ogologo ubọchi nile ka ọ nēme amara, nēbinye kwa ihe;
Nkpuru-ya bu kwa ndi agọziri agọzi.
27 Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe;
Biri kwa rue mb͕e ebighi-ebi.
28 N'ihi na Jehova nāhu ezi ikpé n'anya,
Ọ dighi-arapu kwa ndi-ebere-Ya;
Rue mb͕e ebighi-ebi ka anēdebe ha:
Ma agēbipu nkpuru ndi nēmebi iwu.
29 Ndi ezi omume gēnweta ala,
Biri kwa n'elu ya rue mb͕e ebighi-ebi.
30 Ọnu onye ezi omume nēkwu okwu amam-ihe, dika onye nātughari uche,
Ire-ya nēkwu kwa okwu ezi ikpé.
31 Iwu Chineke-ya di n'obi-ya;
Nzọ-ukwu-ya nile agaghi-ab͕uchapu kwa.
32 Onye nēmebi iwu nēche onye ezi omume nche,
Nāchọ kwa ime ka ọ nwua.
33 Jehova agaghi-arapu ya n'aka-ya,
Ọ gaghi-ama kwa ya ikpe mb͕e anēkpe ya ikpe.
34 Nēle anya Jehova, nēdebe kwa uzọ-Ya,
Ọ gēbuli kwa gi inweta ala:
Mb͕e anēbipu ndi nēmebi iwu, i gāhu.
35 Ahuwom onye nēmebi iwu ka ọ nēme madu ka ha ma jijiji,
Ahuwokwam ya ka ọ nāwasa onwe-ya dika osisi di ndu n'ala mara ya.
36 O we gabiga, ma, le, ọ nọgh:
M'we chọ ya, ma achọtaghi ya.
37 Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi:
N'ihi na ọdi-n'iru diri onye-udo.
38 Ma ndi-njehie, anēkpochapu ha n'otù:
Agēbipu ọdi-n'iru nke ndi nēmebi iwu.
39 Ma nzọputa ndi ezi omume nēsi n'aka Jehova bia:
Ọ bu ebe-ha siri ike na mb͕e nkpà.
40 Jehova nēye-kwa-ra ha aka, nēme ka ha b͕apu:
Ọ nēme ka ha si n'aka ndi nēmebi iwu b͕apu, Ọ nāzọputa kwa ha,
N'ihi na ha ab͕abàwo nime Ya.