Abụ Ọma 19

Elu-igwe nākọ nsọpuru Chineke; Ọ bu kwa ọlu aka-Ya ka mbara elu-igwe nēgosi.
2 Otu ubochi na-agwa ubochi-ibe-ya okwu-onu nuba, Otu abali nekwuputa-kwa-ra abali-ibe-ya ihe-omuma.
3 Okwu-ọnu adighi, ọ dighi kwa okwu di; Anughi olu-ha.
4 N'uwa nile ka eriri-ọtùtù-ha puworo jezue, Na nsọtu elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue. O doworo anyanwu ulo-ikwū nime ha.
5 Anyanwu ahu di kwa ka nwoke nālu nwunye ọhu nke nēsi n'ulo-ndina-ya puta, Obi nātọ ya utọ dika nwoke di ike ib͕aso uzọ-ya.
6 Site n'otù nsọtu elu-igwe ka nputa-ya di, Ib͕a-buruburu-ya diru kwa nsọtu-ya nile: Ọ dighi kwa ihe ezonarioworo okpom-ọku-ya.
7 Iwu Jehova zuru okè, nēweghachi nkpuru-obi: Ihe-àmà Jehova kwesiri ntukwasi-obi, nēme ka onye nēnweghi uche mara ihe.
8 Ukpuru nile Jehova tọrọ ziri ezi, nēme ka obi ṅuria ọṅu: Ihe Jehova nyere n'iwu nēnwu enwu, nēnye anya ìhè.
9 Egwu Jehova di ọcha, nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi: Ikpé nile nke Jehova bu ezi-okwu, ha nile ziri ezi n'otù.
10 Ihe anāchọsi ike ka ha bu, kari ọla-edo, e, kari ọtutu ọla-edo anuchara anucha: Ha di kwa utọ kari manu-aṅu bú nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nātasi.
11 Ọzọ, eji ha dọ orù-Gi aka na nti: N'idebe ha ka ọkpukpu-ọlu riri nne nāputa.
12 Nmehie emehieworo n'amaghi-ama, ònye ga-agbaghara ha? Guam n'onye ikpe ihe-nzuzo nile nāmaghi.
13 B͕ochi kwa orù-Gi na nmehie-nganga; Ekwela ka ha nāchim: mb͕e ahu ka m'gēzu okè, Agāgukwam n'onye ikpe njehie riri nne nāmaghi.
14 Ka okwu nile nke ọnum na ntughari nke obim buru ihe nātọ utọ n'iru Gi, Jehova, bú oké nkumem, na onye-nb͕aputam.