Abù Ọma
Abụ Ọma 108
Edoziwo obim, Chineke;
M'gābù abù, e, m'gābù abù ọma, ọbuná nsọpurum ka m'gēji bù abù.
2 Teta, une na ubọ-akwara: M'gākpọte chi-ọbubọ.
3 M'gēkele Gi n'etiti ndi nile di iche iche, Jehova:
M'gābùku kwa Gi abù ọma netiti mba nile.
4 N'ihi na ebere-Gi di uku kari elu nke elu-igwe,
Ezi-okwu-Gi di kwa uku rue mbara-ígwé.
5 Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke:
Ka ebube-Gi di kwa n'elu uwa nile.
6 Ka ewe dọputa ndi I huru n'anya,
Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi.
7 Chineke ekwuwo okwu n'idi-nsọ-Ya: ka m'ṅuria ọṅu-agha:
M'gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot.
8 Mu nwe Gilead; mu nwe Manase;
Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim;
Juda bu nkpa-n'aka-ezem.
9 Moab bu ite ọsisa-arum;
N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum:
N'aru Filsitia ka m'gēti nkpu.
10 Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike?
Ònye duruworom rue Edom?
11 Ọ̀ bughi Gi, Chineke, juworo ayi aju?
I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha-ayi, Chineke.
12 Yere ayi aka ka ayi pua n'aka onye-nkpab͕u:
N'ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu.
13 Nime Chineke ayi gēme ihe dìnkpà:
Ọ bu kwa Ya onwe-ya gāzọda ndi nākpabu ayi.