Abụ Ọma 50

Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, ekwuwo, We kpọ uwa site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya.
2 Site na Zaion, bú ebe mazuru nma, Ka Chineke nwuputaworo ka ìhè.
3 Ka Chineke-ayi bia, Ya ab͕a-kwa-la nkiti: Ọku nēripia n'iru Ya, Buruburu Ya ka ifufe nēfesi kwa ike nke-uku.
4 Ọ nākpọ elu-igwe nke di n'elu òkù, Nākpọ kwa uwa, ka O we kpe ndi-Ya ikpe:
5 Chikọtaranum ndi-eberem; Bú ndi Mu na ha b͕ara ndu n'elu àjà.
6 Elu-igwe nēgosi kwa ezi omume-Ya; N'ihi na Chineke onwe-ya nēkpe ikpe. Selah
7 Nuru, ndim, M'gēkwu kwa; Nuru, Israel, M'gāb͕a kwa àmà megide gi: Chineke, bú Chineke-gi, ka M'bu.
8 Ọ bughi n'ihi àjà-gi nile ka M'nābara gi nba; Àjà-nsure-ọku-gi nile di kwa n'irum mb͕e nile.
9 M'gaghi-anara oke-ehi n'ulo-gi, M'gaghi-anara nkpi ọ bula n'ogige-ewu-na-aturu-gi.
10 N'ihi na Mu nwe anu-ọhia ọ bula nke oké ọhia, Ya na anu nile n'elu nnù ugwu abua na ọgu iri.
11 Amawom anu-ufe ọ bula nke ugwu nile: Anu nile nke nēnughari n'ọhia di kwa n'akam.
12 Ọ buru na agu aguam, M'gaghi-agwa gi: N'ihi na Mu nwe elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya.
13 M'gēri anu oke-ehi? Ọ̀ bu ọbara nkpi ka m'gāṅu?
14 Chuara Chineke ekele dika àjà; Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere:
15 Kpọkukwam n'ubọchi nkpab͕u; M'gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram.
16 Ma ndi nēmebi iwu ka Chineke gwara okwu, si, Òle ọlu-gi di ya n'ikọ ukpurum nile? Òle ọlu-gi di kwa ya na i būruwo ọb͕ub͕a-ndum n'ọnu-gi?
17 Ebe gi onwe-gi kpọworo idọ-aka-na-nti asì, We tufue okwum nile n'azu gi.
18 Ọ buru na i hu onye-ori, ihe-ya we tọ gi utọ, Gi na ndi nākwa iko ekèkọwo kwa òkè.
19 I rarawo ọnu-gi nye n'ikwu ihe ọjọ, Ire-gi nējikọta kwa aghughọ.
20 I nānọdu ala, nwa-nne-gi ka i nēkwu okwu megide; Nwa nke nne-gi muru ka i nēbo ebubo ugha.
21 Ihe ndia ka i meworo, M'we b͕a nkiti; I chère na adizum ka i di: M'gābara gi nba, do kwa ya n'usoro n'anya-gi.
22 Biko, ghọtanu nka, unu ndi nēchezọ Chineke, Ka m'we ghara idọka unu, ọ dighi kwa onye-nnaputa diri unu:
23 Onye nāchu ekele dika àjà nāsọpurum; Ọ bu kwa onye nēdozi uzọ-ya Ka m'gēme ka ọ hu nzọputa Chineke.