Abụ Ọma 59

Naputam n'aka ndi-irom, Chinekem: Me ka m'si n'aka ndi nēbili imegidem nọ n'ebe di elu.
2 Naputam n'aka ndi nālu ajọ ihe, Zọputakwam n'aka ndi-ọbara.
3 N'ihi na, le, ha echewo nkpuru-obim anwu; Ndi di ike nēzukọ imegidem: Ọ bughi n'ihi njehiem, ọ bughi kwa n'ihi nmehiem, Jehova.
4 Mb͕e ọ nādighi ajọ omume m'mere ha nāb͕a ọsọ, dozie onwe-ha: Kpọte Onwe-gi izutem, hu kwa.
5 Gi onwe-gi kwa, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, Teta ileta mba nile: Emelera ndi nāghọ aghughọ n'ajọ ihe amara. Selah
6 Ha nālaghachi n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita, Nāga obodo buruburu.
7 Le, ha ji ọnu-ha nāsuputa okwu; Mma-agha di n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha: N'ihi na ònye nānu? bu ihe ha kwuru.
8 Ma Gi onwe-gi, Jehova, gāchì ha ọchì; I gākwa mba nile emò.
9 Ikem, Gi ka m'gēlezi anya: N'ihi na Chineke bu ulo-elum.
10 Chineke nke eberem gābia izutem: Chineke gēme ka m'lekwasi ndi nēchem anwu anya.
11 Eb͕ula ha, ka ndim ghara ichezọ: Were usu-ndi-agha-Gi me ka ha nāṅaghari, me kwa ka ha rida, Onye-nwe-ayi, bú ọta-ayi.
12 Nmehie nke ọnu-ha ka okwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha bu; Ka anwude kwa ha nime npako-ha, Na n'ihi ọb͕ub͕a-iyi na n'ihi okwu-ugha nke ha nākọ akukọ-ha.
13 Me ka ha gwusia n'ọnuma-Gi, me ka ha gwusia, ka ha ghara idi ọzọ: Ka ha mara kwa na Chineke nāchi achi nime Jekob, Rue nsọtu nile nke uwa. Selah
14 Ha nālaghachi kwa n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita, Nāga obodo buruburu.
15 Ndi ahu nāṅaghari iri ihe, Ọ buru na afọ ejughi ha ha gānọ kwa ọnọdu-abali.
16 Ma mu onwem gābù abù bayere ike-Gi; E, m'gēti nkpu ọṅù bayere ebere-Gi n'ututu: N'ihi na I buruworom ulo-elu, Na ebe-nb͕alaga n'ubọchi nkpab͕u dirim.
17 Ikem, Gi ka m'gābùku abù ọma: N'ihi na Chineke bu ulo-elum, bú Chineke nke eberem.