Abụ Ọma 102

Jehova, nuru ekperem, Ka ntikum ru kwa Gi nti.
2 Ezonarilam iru-Gi n'ubọchi ahuhu m'nāhu: Tọ nti-Gi n'ala n'ebe m'nọ; N'ubọchi m'nākpọku Gi zam ngwa ngwa.
3 N'ihi na ubọchim nile agwusiwo n'anwuru-ọku, Erechapuwo kwa ọkpukpum nile dika ọlọkọ-ọku.
4 Etib͕uwo obim dika ihe akuru n'ala, o we kpọnwua; N'ihi na echezọwom iri nrim.
5 Site n'olu ize-umem Ọkpukpum araparawo n'anu-arum.
6 Eyirim okwolo nke ọzara; Aghọwom ihe dika okwukwu nke nkpọnkpọ ebe.
7 Amuruwom anya, we ghọ Ihe dika nnunu ntà nke nání ya nọ n'elu-ulo.
8 Ogologo ubọchi nile ka ndi-irom nātam uta; Ndi nāwi ara imegidem ejiwom ṅua iyi.
9 N'ihi na eriwom ntu dika nri, Were kwa ikwa-ákwá gwakọta ihe-ọṅuṅum.
10 Site n'iwe-Gi na ọnuma-Gi: N'ihi na I buliwom elu, we tufuem.
11 Ubọchim nile di ka onyinyo nke nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu; Mu onwem nākpọnwu kwa dika ihe akuru n'ala.
12 Ma Gi onwe-gi, Jehova, nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi; Ncheta-Gi nādiru kwa ọb͕ọ nile.
13 Gi onwe-gi gēbili, nwe obi-ebere n'aru Zaion: N'ihi na mb͕e eruwo imere ya amara, n'ihi na mb͕e akara àkà abiawo.
14 N'ihi na nkume-ya nile nātọ ndi-orù-Gi utọ, Ha nēme-kwa-ra ájá-ya amara.
15 Mba nile gātu kwa egwu aha Jehova, Eze nile nke uwa gātu kwa egwu ebube-Gi:
16 N'ihi na Jehova ewuwo Zaion, O mewo Onwe-ya ka ahú Ya nime ebube-ya.
17 O chewo ekpere nke onye nēnweghi ihe iru, O ledaghi kwa ekpere-ha anya.
18 Agēde nka n'akwukwọ nye ọb͕ọ nēso n'azu: Ọzọ, otù ndi nke agēkè gēto Ja.
19 N'ihi na O siwo n'ebe di elu nke ebe nsọ Ya lepu anya; Jehova esitewo n'elu-igwe legide uwa anya;
20 Inu ize-ume nke onye-nkpọrọ; Itọpu ndi nāghaghi inwu anwu;
21 Ka ha we kọ akukọ aha Jehova nime Zaion, Kọ kwa akukọ otuto-Ya nime Jerusalem;
22 Mb͕e ndi nile di iche iche gāchikọta onwe-ha n'otù, Ha na ala-eze nile, ifè Jehova òfùfè.
23 O wedawo ikem n'uzọ; O bilatawo ubọchim nile.
24 Asirim, Chinekem, emela ka m'la n'elu n'etiti ubọchim nile: N'ọb͕ọ nile ka arọ-gi nādigide.
25 Na mb͕e ochie ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa; Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa.
26 Ha onwe-ha gāla n'iyì, ma Gi onwe-gi nēguzogide: Ha nile gāka kwa nká dika uwe; Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāb͕anwe ha, agāb͕anwe kwa ha:
27 Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile, Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu
28 Umu nke ndi-orù-Gi gēbigide, Nkpuru-ha gēguzosi ike n'iru Gi.