Abụ Ọma 106

Tonu Ja. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
2 Ònye gākọ akukọ idi-ike nile nke Jehova? Ònye gēme ka anuru otuto-Ya nile?
3 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe ikpé bu, Ha na onye nēme ezi omume na mb͕e nile.
4 Chetam, Jehova, were ka ihe ndi-gi si atọ Gi utọ chetam; Were nzọputa-Gi letam:
5 Ka m'we lekwasi ọdi-nma nke ndi I rọputaworo, Ka m'we ṅuria n'ọṅù mba-Gi, Ka m'we soro ihe-nketa-Gi nya isi.
6 Ayi esowo nna-ayi-hà mehie, Ayi emewo ajọ omume, ayi emebiwo iwu.
7 Nna-ayi-hà enweghi uche ighọta oké ọlu-Gi nile n'Ijipt; Ha echetaghi iba-uba nke ebere-Gi nile; Ha we nupu isi n'akuku oké osimiri, bú n'Oké Osimiri Uhie.
8 Ma Ọ zọputara ha n'ihi aha-Ya, Ime ka amara idi-ike-Ya.
9 O we basiere Oké Osimiri Uhue nba, o we tasia: O we me ka ha nēje ije n'ob͕u-miri-ya nile dika ọ bu ọzara.
10 O we zọputa ha n'aka onye nākpọ ha asì, B͕aputa kwa ha n'aka onye-iro-ha.
11 Miri we kpuchie ndi nākpab͕u ha: Ọ dighi otù onye nime ha fọduru.
12 Ha we kwere okwu-Ya nile; Ha nābù abù otuto-Ya.
13 Ha chezọrọ ọlu-Ya nile ngwa ngwa; Ha echeghi ndum-ọdu-Ya:
14 Ha we chọ ajọ ọchichọ n'ọzara, We nwa Chineke n'ala tọb͕ọrọ n'efu.
15 O we nye ha ihe ha riọrọ; Ma O zitere aru-ọtita na nkpuru-obi-ha.
16 Ha kwo-kwa-ra Moses ekworo n'ọmuma-ulo-ikwū-ha, Kwo kwa Eron, bú onye nsọ nke Jehova.
17 Ala nēmeghe, we loda Detan, Kpuchi kwa nzukọ Abairam.
18 Ọku we nēre n'etiti nzukọ-ha; Ire-ọku nērepia ndi nēmebi iwu.
19 Ha nēme nwa-ehi na Horeb, We kpọ isi ala nye ihe awuru awu.
20 Ha we b͕anwe nsọpuru-ha N'ihe-atù nke ehi nāta ihe akuru n'ala.
21 Ha chezọrọ Chineke, bú Onye-nzọputa-ha, Onye nēmeri ihe uku di iche iche n'Ijipt;
22 Oké ọlu di iche iche n'ala Ham, Na ihe di egwu di iche iche n'akuku Oké Osimiri Uhie.
23 O we si na O gēkpochapu ha, Ma ọ buru na Moses, bú onye Ọ rọputaworo, eguzoghi na ntiwa ahu n'iru Ya, Ime ka ọnuma-Ya si n'ibibi ha laghachi.
24 Ọzọ, ha juru ala anāchọsi ike, Ha ekweghi okwu-Ya;
25 Ha we tamu n'ulo-ikwū nile ha, Ha egeghi nti n'olu Jehova.
26 O we welie aka-Ya elu n'ebe ha nọ, Ime ka ha da n'ọzara:
27 Na ime ka nkpuru-ha da n'etiti mba nile, Na ichusa ha n'ala nile.
28 Ha kekọta-kwa-ra onwe-ha n'aru Beal-peoa, We rie àjà nile nke ihe nwuru anwu.
29 Ha we were omume nile ha kpasue Ya iwe: Ihe-otiti we dakwasi ha.
30 Finehas wee guzo ọtọ, me ihe ekpere n'ikpe: Ewe b͕ochi ihe-otiti ahu.
31 Ewe guara ya nka n'ezi omume, Rue ọb͕ọ nile rua mb͕e ebighi-ebi.
32 Ha kpasu-kwa-ra Ya iwe na miri Meriba, O we jọrọ Moses njọ n'ihi ha:
33 N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru Mọ-Ya, O we were eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua kwue okwu efu.
34 Ha ekpochapughi ndi di iche iche ahu, Dika Jehova siri ha;
35 Ma ha gwakọtara onwe-ha na mba nile nke ala ahu, We muta ọlu nile ha:
36 Ha we fè arusi nile ha òfùfè; Arusi ahu we ghọrọ ha ọnyà:
37 Ọzọ, ha were umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom chuara ndi-mọ ọjọ àjà,
38 We wusi ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ, bú ọbara nke umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom, Ndi ha were chuara arusi nile nke Kenean àjà; Ewe were ọbara merua ala ahu.
39 Ewe were ọlu nile ha me ka ha buru ihe ruru árú, Ha we nākwa iko n'omume nile ha.
40 Iwe Jehova we di ọku n'aru ndi-Ya, O we kpọ ihe-nketa-Ya ihe-árú.
41 O we nye ha n'aka mba di iche iche; Ndi nākpọ ha asì we nāchi ha.
42 Ndi-iro-ha meb͕u-kwa-ra ha, Ewe me ka ha ruru ala n'okpuru aka-ha.
43 Ọtutu mb͕e ka Ọ nanaputa ha; Ma ha onwe-ha nānupu isi n'okpuru Chineke na ndum-ọdu-ha, Ewe kwada ha n'ajọ omume-ha.
44 O we lekwasi ahuhu diri ha anya, Mb͕e Ọ nuru iti-nkpu-ha:
45 O we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya nye ha, We chègharia dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.
46 O we me ha ka enwe obi-ebere nile n'aru ha N'iru ndi nile ndi nādọta ha n'agha.
47 Zọputa ayi, Jehova, bú Chineke-ayi, Chikọputa kwa ayi n'etiti mba nile Ikele aha nsọ Gi, Na inya isi n'otuto-Gi.
48 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu, Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi. Ka ndi Israel nile si kwa, Amen. Tonu Ja.