Abù Ọma
Abụ Ọma 79
Chineke, mba di iche iche abatawo n'ihe-nketa-Gi;
Ha emeruwo ulo uku Gi di nsọ;
Ha emewo Jerusalem ka ọ ghọ ihe etikpọro etikpọ.
2 Ha ewerewo ozu ndi-orù-Gi nye iburu anu-ufe nke elu-igwe ihe-oriri,
Were kwa anu-aru nke ndi-ebere-Gi nye anu-ọhia nile nke uwa.
3 Ha awusiwo ọbara-ha dika miri buruburu Jerusalem;
Ọ dighi kwa onye ọ bula ṅēli ozu-ha.
4 Ayi aghọworo ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta,
Ghọ-kwa-ra ndi di ayi buruburu ihe-ichì-ọchì na ihe-ikwa-emò.
5 Rùe ole mb͕e, Jehova, ka I ganēwe iwe rue mb͕e ebighi-ebi?
Ekworo-Gi, ọ̀ ganēre dika ọku?
6 Wukwasi mba nile ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi,
Wukwasi kwa ala-eze nile nke nākpọkughi aha-Gi.
7 N'ihi na ha eripiawo Jekob,
Me kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.
8 Echetala ajọ omume nile nke ndi-mbu-ayi imegide ayi:
Kwe ka obi-ebere-Gi nile me ngwa izute ayi:
N'ihi na ayi enweghi ike ma-ọli.
9 Yere ayi aka, Chineke nke nzọputa-ayi, n'ihi nsọpuru aha-Gi:
Naputa kwa ayi, kpuchi kwa nmehie-ayi, n'ihi aha-Gi.
10 N'ìhi gini ka mba nile nāsi, Òle ebe Chineke-ha nọ?
Ka amara ya n'etiti mba nile n'anya-ayi,
Bú ibọ̀-ọ́bọ̀ ọbara nke ndi-orù-Gi nke awusiworo.
11 Kwe ka isu-ude nke onye-nkpọro bata n'iru Gi;
Dika idi-uku nke ogwe-aka-Gi si di me ka ndi nāghaghi inwu anwu fọdu;
12 Gi nyeghachi kwa ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta-ha nime obi-ha okpukpu asa,
Bú nke ha jiri ta Gi uta, Onye-nwe-ayi.
13 Ayi onwe-ayi, bú ndi-Gi na ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-gi,
Gēkele Gi rue mb͕e ebighi-ebi;
Ọb͕ọ nile ka ayi gākọrọ akukọ otuto-Gi.