Abụ Ọma 114

Mb͕e Israel siri n'Ijipt puta, Mb͕e ulo Jekob siri na ndi nātatọ okwu puta;
2 Juda ghọro ebe nsọ Ya, Israel ghọrọ ala Ọ nāchi.
3 Oké osimiri huru ya, we b͕alaga; Jọdan chighariri la azu.
4 Ugwu nile wuliri elu dika ebulu, Ugwu ntà nile wuliri elu dika umu-aturu.
5 Gini nēme gi, oké osimiri, na i nāb͕a ọsọ? Gini nēme gi, Jọdan, na i nēchighari la azu?
6 Gini nēme unu, ugwu, na unu nāwuli elu dika ebulu? Gini nēme unu, ugwu ntà, na unu nāwuli elu dika umu-aturu?
7 Ka o b͕ue gi nb͕u, gi uwa, site n'iru Onye-nwe-ayi, Site n'iru Chineke nke Jekob;
8 Onye b͕anwere oké nkume ka ọ ghọ ọdọ-miri juputara na miri, B͕anwe ọmú ka ọ ghọ isi-iyi miri.