Abụ Ọma 89

Ebere nile nke jehova ka m'gābù abù-ha rue mb͕e ebighi-ebi: Ọb͕ọ nile ka m'gēwere ọnum me ka ha mara ikwesi-ntukwasi-obi-Gi.
2 N'ihi na asiwom, Rue mb͕e ebighi-ebi ka agēwuli ebere elu dika ulo; Elu-igwe, I gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi guzosie ike nime ha.
3 Mu na onye M'rọputara ab͕awo ndu, Aṅuworom Devid, bú orùm, iyi;
4 Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēme ka nkpuru-gi guzosie ike, M'gēwu kwa oche-eze-Gi rue ọb͕ọ nile. Selah
5 Elu-igwe gēkele kwa oké ọlu-Gi, Jehova; Kele kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nime nkpọkọta nke ndi nsọ.
6 N'ihi na ònye nime mbara-ígwé ka agēji turu Jehova? Ònye yiri Jehova n'etiti umu Chineke?
7 Ọ bu Chineke Nke anāmara jijiji ri nne n'ìzù nzuzo nke ndi nsọ, Ọ bu kwa Onye anātu egwu Ya kari ndi nile di Ya buruburu.
8 Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, Ònye di ike dika Gi, Ja? Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di kwa Gi buruburu.
9 Gi onwe-gi nāchi nbili-elu nke oké osimiri: Mb͕e nmali-miri-ya nile nēbuli onwe-ha elu, Gi onwe-gi nēme ka ha dajua.
10 Gi onwe-gi azọpiawo Rehab, dika onye eb͕uru eb͕u; I werewo ogwe-aka nke ike-Gi chusa ndi-iro-Gi.
11 Gi nwe elu-igwe, Gi nwe kwa uwa: Elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya, Gi onwe-gi atọwo ntọ-ala-ha.
12 Ugwu na Ndida, Gi onwe-gi ekèwo ha: Teboa na Heamon nēti nkpu ọṅù n'aha-gi.
13 Gi nwere ogwe-aka nke idi-ike di nime ya: Aka-Gi di ike, aka-nri-Gi di elu.
14 Ezi omume na ikpe ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Gi: Ebere na ezi-okwu nāga n'iru Gi.
15 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu nke mara olu iti-nkpu ahu: Jehova, n'ìhè nke iru-Gi ka ha nēje ije.
16 N'aha-Gi ka ha nēteghari egwú ọṅù ogologo ubọchi nile: Ọ bu kwa n'ezi omume-Gi ka ha nādi elu.
17 N'ihi na ima-nma nke ike-ha ka I bu: Ọ bu kwa n'utọ ihe-ayi nātọ Gi ka mpi-ayi nādi elu.
18 N'ihi na Jehova nwe ọta-ayi; Ọ bu kwa Onye Nsọ nke Israel nwe eze-ayi.
19 Mb͕e ahu I gwara ndi-ebere-Gi okwu n'ọhù, Si, Atukwasiwom iye-aka n'aru dike; Emewom ka otù onye arọputaworo n'etiti ndim di elu.
20 Achọtawom Devid, bú orùm; Ewerewom manu nsọm te ya:
21 Onye akam gēguzosi ike n'ebe ọ nọ; Ọzọ, ogwe-akam gāb͕a ya ume.
22 Onye-iro agaghi-abiakwasi ya na mberede; Ọzọ, nwa nke ajọ omume agaghi-eweda ya n'ala.
23 M'gētipia kwa ndi nākpab͕u ya n'iru ya, Ti kwa ndi nākpọ ya asì ihe.
24 Ma ikwesi-ntukwasi-obim na eberem gādi n'aru ya: Ọ bu kwa n'aham ka mpi-ya gādi elu.
25 M'gēdo kwa aka-ya n'oké osimiri, Do kwa aka-nri-ya n'osimiri nile.
26 Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu, Chinekem, na oké nkume nke nzọputam.
27 Ọzọ, Mu onwem gēme ya ọkparam, Onye kachasi ihe nile elu n'ebe ndi-eze nke uwa nọ.
28 Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēdebere ya eberem, Ọb͕ub͕a-ndum gēkwesi-kwa-ra ya ntukwasi-obi.
29 M'gēme kwa ka nkpuru-ya dirue mb͕e ebighi-ebi, Me kwa ka oche-eze-ya di ka ubọchi nile nke elu-igwe.
30 Ọ buru na umu-ya arapu iwum, Ghara kwa ijeghari n'ikpém nile;
31 Ọ buru na ha eme ka ukpurum nile ghara idi nsọ, Ọ buru kwa na ha edebeghi ihe nile M'nyere n'iwu;
32 M'gēwere kwa nkpa-n'aka leta njehie-ha, Were kwa ihe-otiti leta ajọ omume-ha.
33 Ma M'gaghi-esi n'ebe ọ nọ mebie eberem, M'gaghi-ekwu kwa okwu-ugha megide ikwesi-ntukwasi-obim.
34 M'gagh-eme ka ọb͕ub͕a-ndum ghara idi nsọ, Ọzọ, M'gagh-agbanwe ihe siworo n'eb͕ub͕ere-ọnum abua puta.
35 Otù ub͕ò ka M'jiworo idi-nsọm ṅua iyi; M'gaghi-agwa Devid okwu-ugha ma-ọli;
36 Nkpuru-ya gādiru mb͕e ebighi-ebi, Oche-eze-ya gādi kwa ka anyanwu n'irum.
37 Dika ọnwa ka o gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi; Ọzọ, Onye-àmà Nke nọ na mbara-ígwé kwesiri ntukwasi-obi. Selah
38 Ma Gi onwe-gi achipuwo, ju kwa aju. I wesabigawo onye-Gi etere manu iwe ókè.
39 I sọwo ọb͕ub͕a-ndu nke orù-Gi oyi: I mewo ka okpu-eze-ya ghara idi nsọ ọbuná rue ala.
40 I tiwawo ogige-ya nile; I mewo ka ebe-ya nile ewusiri ike buru ihe dapiara adapia.
41 Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ apunarawo ya ihe: Ọ ghọworo ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ita-uta.
42 I mewo ka aka-nri nke ndi nākpab͕u ya di elu; I mewo ka ndi-iro-ya nile ṅuria.
43 Ọzọ, I nēme ka ọnu mma-agha-ya laghachi azu, I meghi kwa ka o guzosie ike n'agha.
44 I mewo ka onwunwu-ọcha-ya kwusi, I tudawo kwa oche-eze-ya rue ala.
45 I bilatawo ubọchi nile ọ bu okorọbia: I werewo ihere kpuchie ya n'aru. Selah
46 Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēzobe onwe-gi ebighi-ebi? Rùe ole mb͕e ka ọnuma-Gi ganēre dika ọku?
47 Cheta otú mb͕e ndu mu onwem di nkpunkpu: Ọ̀ bu ihe-efu gini ka I kèworo umu madu nile nye?
48 Òle nwoke ọ bu nke gādi ndu, ghara ihu ọnwu anya, Nke gēme ka nkpuru-obi-ya wepuga onwe-ya n'aka ala-mọ? Selah
49 Òle ebe ebere, mbu Gi nile di. Onye-nwe-ayi, Nke I ṅuru Devid iyi bayere ha n'ikwesi-ntukwasi-obi-Gi?
50 Onye-nwe-ayi, cheta ita-uta ndi-orù-Gi; Eburuwom n'obim ita-uta nke ndi nile di iche iche bara uba;
51 Nke ndi-iro-Gi jiworo ta uta, Jehova, Nke ha jiworo ta nzọ-ukwu nile nke onye-Gi etere manu uta.
52 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu rue mb͕e ebighi-ebi. Amen, na Amen.