Abù Ọma
Abụ Ọma 24
Jehova nwe uwa na ùjú-ya;
Elu-uwa dum madu bi na ndi bi nime ya.
2 N'ihi na Ya onwe-ya atọwo ntọ-ala-ya n'elu oké osimiri nile,
Me kwa ka o guzosie ike n'elu osimiri nile.
3 Ònye gārigo n'ugwu Jehova?
Ònye gēguzosi kwa ike n'ebe nsọ Ya?
4 Onye nwere ọbu-aka abua nēmeghi ihe ọjọ, na obi di ọcha;
Onye nēbulighi nkpuru-obi-ya nye ihe-efu,
Ọ ṅughi kwa iyi aghughọ.
5 Ọ gānata ngọzi n'aka Jehova,
Na ezi omume naka Chineke nke nzọputa-ya.
6 Nka bu ọb͕ọ nke ndi nācho Ya,
Bú ndi nāchọsi iru-Gi ike, Chineke nke Jekob.
Selah
7 Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu;
Ka ebuli kwa unu elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi:
Eze ebube gābata kwa.
8 Ònye kwa bu Eze ebube a?
Ọ bu Jehova, Nke bu dìnkpà na dike,
Ọ bu Jehova, Nke bu dike n'agha.
9 Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu;
Buli-kwa-nu ha elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi:
Eze ebube gābata kwa.
10 Ònye ka Ọ bu, bú Eze ebube a?
Ọ bu Jehova nke usu nile nke ndi-agha,
Ya onwe-ya bu Eze ebube a.