Abù Ọma
Abụ Ọma 26
Kpem ikpe, Jehova, n'ihi na mu onwem ejewo ije n'izu-okèm:
Ọ bu kwa na Jehova ka m'tukwasiworo obi, ukwum adighi-ab͕uchapu.
2 Nwà m, Jehova, nwaputakwam;
Nucha akurum abua na obim.
3 N'ihi na ebere-Gi di n'iru anyam;
Ejeghariwokwam n'ezi-okwu-Gi.
4 Mu na madu efu anọkọghi;
Mu na ndi-iru-abua adighi-abàkọ kwa.
5 Akpọwom nkpọkọta ndi nēme ihe ọjọ asì,
Mu na ndi nēmebi iwu adighi-anọkọ kwa.
6 Agamakwo ọbu-akam abua na-emeghi-ihe-ọjọ;
We b͕a ebe-ichu-àjà-Gi buruburu otú a, Jehova:
7 Ime ka ege nti olu ekele,
Na ikọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.
8 Jehova, ahuwom ebe-obibi nke ulo-gi n'anya,
Ya na ọnọdu nke ebe-obibi nke ebube-Gi.
9 Achikọtala nkpuru-obim na ndi-nmehie n'otù,
Achikọta-kwa-la ndum na ndi-ọbara n'otù:
10 Ndi nzube ọjọ di n'ka-ha,
Aka-nri-ha juputa-kwa-ra n'iri-ngo.
11 Ma mu onwem, n'izu-okèm ka m'gēje ije:
B͕aputam, me-kwa-ram amara.
12 Ukwum eguzowo n'ala di lari:
Nime nkpọkọta madu nile ka m'gāgọzi Jehova.