Abù Ọma
Abụ Ọma 38
Jehova, abalaram nba n'iwe-Gi:
Adọ-kwa-lam aka na nti n'ọnuma-Gi.
2 N'ihi na àkú-Gi nile efedakwasiwom,
Aka-Gi adakwasiwokwam.
3 Ọ dighi izu-okè ọ bula di n'anu-arum n'ihi iwe-Gi;
Ọ dighi kwa udo ọ bula di n'ọkpukpum nile n'ihi nmehiem.
4 N'ihi na ajọ omumem nile agabigawo n'elu isim:
Dika ibu arọ́ ha dikaram arọ́.
5 Ufiri-utalim nile nēsì ísì, nāb͕u kwa miri,
N'ihi uchem b͕agọro ab͕agọ.
6 Ab͕agọrọm ab͕agọ ruda kwa nke-uku;
Ogologo ubọchi nile ka m'jeghariworo nēyi uwe-nkpe.
7 N'ihi na úkwùm juputara na nruru-ọku;
Ọ dighi kwa izu-okè ọ bula di n'anu-arum.
8 Arum esinwuwo, egwepiawokwam nke-uku:
Ab͕ọwom uja n'ihi isu-ude nke obim.
9 Onye-nwe-ayi, n'iru Gi ka ichọsi-ikem nile di;
Ize-umem ezonarighi kwa Gi.
10 Obim nēti ike ike, ikem esiwo nimem la:
Ìhè nke anyam abua kwa, ọbuná ìhè nke anyam ahu adighi n'arum.
11 Ndi nāhum n'anya na ndi-eyìm nēguzo iche na ncherita-iru ihe-otitim;
Ndi-ab͕ata-obim nēguzo kwa n'ebe di anya.
12 Ndi nāchọsi nkpuru-obim ike nēsi-kwa-ram ọnyà;
Ndi nāchọ imem ihe ọjọ ekwuwo kwa ihe-ila-n'iyì di iche iche,
Ọ bu kwa ihe-aghughọ nile ka ha nātughari n'uche ogologo ubọchi nile.
13 Ma mu onwem, dika onye nti chiri, adighm-anu ihe;
Adikwam ka onye-ob͕i nke nādighi-asaghe ọnu-ya.
14 E, adim ka madu nke nādighi-anu ihe
Onye iba-nba ọ bula nādighi n'ọnu-ya.
15 N'ihi na Gi, Jehova, ka m'chereworo:
Gi onwe-gi gāza, Onye-nwe-ayi, Chinekem.
16 N'ihi na asirim, Ka ha ghara iṅuri ọṅu n'arum:
Mb͕e anēwezuga ukwum n'ọnọdu-ya, ha mere onwe-ha ka ha di uku imegidem.
17 N'ihi na mu owem gaje ije nsukwra-achi,
Ihe-nb͕um di kwa na ncherita-irum mb͕e nile.
18 N'ihi na m'gēgosi ajọ omumem;
M'gēcheb͕u onwem bayere nmehiem.
19 Ma ndi-irom nādi ndu, nwe ume:
Ha ba-kwa-ra uba, bú ndi nākpọm asì n'uzọ okwu-ugha.
20 Ndi ahu kwa nke nākwughachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe
Nēmegidem, n'ihi na anamab͕aso ezi ihe.
21 Arapulam, Jehova:
Chinekem, anọlam n'ebe di anya.
22 Bia ọsọsọ iyerem ka,
Onye-nwe-ayi, bú nzọputam.