Abụ Ọma 110

Ihe nke si n'ọnu Jehova puta nāsi onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-gi ka ihe-nb͕akwasi diri ukwu-gi abua.
2 Nkpa-n'aka nke ike-gi ka Jehova gēsi na Zaion ziputa: Gi nwe ike n'aru madu n'etiti ndi-iro-gi.
3 Ndi-gi bu onyinye-afọ-ofufo n'ubọchi usu-ndi-agha-gi; N'ima-nma nile nke idi-nsọ, site n'afọ nke ututu; Gi nwe igirigi, bú umu-okorọbia-gi.
4 Jehova aṅuwo iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi Dika usoro Melkizedek si di.
5 Onye-nwe-ayi n'aka-nri-gi Amapúwo ndi-eze n'ubọchi iwe-Ya.
6 Ọ gēkpe ikpe n'etiti mba nile, Ebe nile juputara n'ozu; Ọ mapúwo isi madu n'elu ọtutu ala.
7 Miri nke sitere na miri-iyi nke di n'uzọ ka Ọ gāṅu: N'ihi nka ka Ọ gēweli isi-Ya elu.