Abụ Ọma 136

Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
2 Kelenu Chineke kachasi chi nile: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
3 Kelenu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
4 Kelenu Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
5 Kelenu Onye ji nghọta eme elu-igwe: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
6 Kelenu Onye meworo ala ka ọ sa mbara n'elu miri: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
7 Kelenu Onye meworo ìhè uku di iche iche: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
8 Bú anyuanwu ichi n'ehihie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
9 Na ọnwa na kpakpando ichi n'abali: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
10 Kelenu Onye nētib͕u Ijipt nime umu-ha eburu uzọ mu: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
11 O we me ka Israel si n'etiti ha puta: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
12 Site n'aka di ike na n'ogwe-aka esetiri eseti: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
13 Kelenu Onye kebiworo Oké Osimiri Uhie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
14 O we me ka Israel gabiga n'etiti ya: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
15 Ma O rurupuru Fero na usu-ndi-agha-ya n'Oké Osimiri Uhie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
16 Kelenu Onye nēme ka ndi-Ya je ije n'ọzara: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ēbi ka ebere-Ya di.
17 Kelenu Onye tib͕uworo ndi-eze di uku: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
18 O b͕u-kwa-ra ndi-eze di ebube: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
19 Bú Saihon eze ndi-Amorait: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
20 Na Og eze Beshan: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
21 O we nye ala-ha ibu ihe-nketa: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
22 Iburu Israel, bú orù-Ya, ihe-nketa: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
23 Onye chetara ayi n'ọnọdu-ayi di ala: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
24 O we naputa ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi. N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
25 Ọ nēnye anu-aru nile nri: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
26 Kelenu Chineke nke elu-igwe: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.