Abụ Ọma 58

Ọ̀ bu ezie na ezi omume nke kwesiri ka unu kwue bu ob͕i? Ùnu ji izi-ezi kpe ikpe, unu umu madu?
2 É-è, kama ọ bu nime obi ka unu nēme ajọ omume nile; Unu nātùzi ihe-ike nke aka-unu n'uwa.
3 Emewo ka ndi nēmebi iwu buru ndi ala ọzọ site n'àkpà-nwa: Ha akpafuwo site n'afọ nne-ha, nēkwu okwu-ugha.
4 Edide ha nwere yiri edide agwọ: Ha di ka aju-ala nke nti chiri nke nākpọchi nti-ya;
5 Nke nādighi-ege nti olu nke ndi nārà agwọ, Ma-ọbu nke dibia nārafu arafu, bú onye emeworo ka ọ mara ihe.
6 Chineke, tijie ezé nile ha n'ọnu-ha: Tikwopu ezé uku nile nke umu-ọdum, Jehova.
7 Ka ha b͕aze dika miri nke nērùghariri onwe-ya: Mb͕e o nēdo àkú-ya nile, ka ha di ka anēbipu ọnu-ha.
8 Ka ha di ka ejula nāga nāb͕aze, Dika nwa nwanyi mukworo amukwo, dika ndi ọ dighi mb͕e ha huru anyanwu.
9 Tutu ite-unu amata ọku ogwu, Ma ihe di ndu ma ihe di ọku, Ọ nēfepusi ha ike dika oké ifufe.
10 Onye ezi omume gāṅuri mb͕e ọ huru ọ́bọ̀ ahu: Ọ gāsa nzọ-ukwu-ya nile n'ọbara onye nēmebi iwu.
11 Madu gāsi kwa, N'ezie nkpuru diri onye ezi omume: N'ezie Chineke di Nke nēkpe ikpe n'uwa.