Abụ Ọma 53

Onye-nzuzu asiwo n'obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di. Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka ajọ omume-ha buru ihe-árú; Ọ dighi onye nēme ezi ihe.
2 Chineke siri n'elu-igwe lekwasi umu madu anya, Ihu ma ọ di onye nwere uche, Nke nāchọ Chineke.
3 Ha nile n'otù n'otù alaghachiwo azu; ha ab͕aruwo n'otù dika miri; Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye.
4 Ndi nālu ajọ ihe, hà amaghi ihe? Bú ndi riworo nri site n'iri ndim, Ma ha akpọkughi Chineke.
5 N'ebe ahu ka ha turu oké egwu, n'ebe oké egwu nādigh: N'ihi na Chineke esesawo ọkpukpu nke onye nāma ulo-ikwū-ya imegide gi; I mewo ka ihere me ha, n'ihi na Chineke ajuwo ha.
6 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nzọputa Israel esi na Zaion puta! Mb͕e Chineke gēji me ka ndọta-n'agha ndi-Ya lata, Ka Jekob tegharia egwú ọṅù, ka Israel ṅuria ọǹu.