Abụ Ọma 67

Ka Chineke mere ayi amara, gọzie ayi, Me ka iru-Ya mua n'ebe ayi nọ; Selah
2 Ka ewe mara uzọ-Gi n'uwa, Mara nzọputa-Gi n'etiti mba nile.
3 Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke; Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile.
4 Ka mba nile ṅuria, ti kwa nkpu ọṅù: N'ihi na I gēkpe ndi nile n'uwa ikpe ziri ezi, Mba nile n'uwa ka I gēdu kwa. Selah
5 Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke; Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile.
6 Ala emewo ihe-ọmume-ya: Chineke, bú Chineke-ayi, gāgọzi ayi.
7 Chineke gāgọzi ayi; Nsọtu nile nke uwa gātu kwa egwu Ya.