Abụ Ọma 61

Chineke, nuru olu iti-nkpum; Ṅa nti ekperem.
2 M'nēsi na nsọtu uwa kpọkue Gi, mb͕e, obim nādighi ike: Rue n'oké nkume nke kam elu ka I gēdurum je.
3 N'ihi na I buworom ebe-nb͕abà, Ulo-elu di ike ipu n'iru onye-iro.
4 Ka m'nọ dika ọbìa n'ulo-ikwū-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi: M'gāb͕abà n'ebe-nzuzo nke nkù-Gi abua. Selah
5 N'ihi na Gi onwe-gi, Chineke, egewo nti nkwa nile m'kwere: I werewo ihe-nnweta nke ndi nātu egwu aha-Gi nye ha.
6 I gātukwasi ọtutu ubọchi n'ubọchi ndu eze: Arọ-ya nile gādi ka ọtutu ọb͕ọ.
7 O gēbi n'iru Chineke rue mb͕e ebighi-ebi: Wezuga ebere na ezi-okwu, ka ha we nēchezi ya.
8 Otú a m'gābùku aha-Gi abù ọma rue mb͕e ebighi-ebi, Ka m'we kwughachi nkwam nile kwa-ubọchi.