Abụ Ọma 75

Ayi ekelewo Gi, Chineke; Ayi ekelewo ekele, aha-Gi di kwa nso: Ha akọwọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.
2 Mb͕e m'gānara mb͕e akara àkà, Mu onwem gēkpe ikpe ziri ezi.
3 Ndi gbazeworo agbaze ka uwa na ndi nile ndi bi nime ya bu: Mu onwem atùwo ogidi nile ya. Selah
4 Asirim ndi nānya isi, Unu anyala isi: Asi-kwa-ram ndi nēmebi iwu, Unu ebulila mpi elu:
5 Unu ebulila mpi-unu rue ebe di elu; Unu ejila olu kwesiri ike kwue oké okwu.
6 N'ihi na ọ bughi n'Ọwuwa-anyanwu, ma-ọbu n'Ọdida-anyanwu, Ọ bughi kwa n'ọzara, ka nbuli-elu nēsi bia.
7 Kama Chineke bu onye-ikpe: Ọ nēme otù onye ka ọ di ala, Ọ nēbuli kwa onye ọzọ elu.
8 N'ihi na iko di n'aka Jehova, manya-vine nke di nime ya asuwo ufufu; O juputara na manya ejiri ihe gwa, O we si na nke ahu b͕aputa manya: N'ezie ọru-ala-ya nile, ndi nile n'uwa ndi nēmebi iwu gāzaputa ya ṅua.
9 Ma mu onwem, m'gēgosi oké ọlu-Gi rue mb͕e ebighi-ebi, M'gābùku Chineke nke Jekob abù ọma.
10 Ọzọ, mpi nile nke ndi nēmebi iwu ka m'gēbipu; Ma agēbuli mpi nile nke onye ezi omume.