Abụ Ọma 76

Onye amaworo na Juda ka Chineke bu: N'Israel ka aha-Ya di uku.
2 Ọ bu kwa na Selem ka ulo-ntu-Ya di Ebe-obibi-Ya di kwa na Zaion.
3 N'ebe ahu ka Ọ b͕ajiri àkú nile nēb͕u àmùmà nke uta; Na ọta, na mma āgha, na agha. Selah
4 Onye juputara n'ihè ka I bu, I di ebube, nēsite n'ugwu nile nke anu adọb͕uru.
5 Akwatawo ihe ndi nwere obi ike n'agha, ha atuwo òrù-ura-ha; Ha achọtaghi kwa aka-ha, bú ndi nile bu dìnkpà.
6 Site n'ibasi-nba-ike nke Gi, Chineke nke Jekob, Ma ub͕ọ-ala ma inyinya adawo n'oké ura.
7 Gi onwe-gi, Onye anātu egwu ka I bu: Ọzọ, ònye gēguzo n'iru Gi site na mb͕e I were iwe?
8 I siri n'elu-igwe me ka anuru okwu ikpé; Uwa turu egwu, we di jū,
9 Mb͕e Chineke biliri ikpe ikpe, Izọputa ndi nile di ume-ala n'obi nke uwa. Selah
10 N'ihi na ọnuma madu gēkele Gi: I gēji ọnuma nile nke fọduru ke n'úkwù.
11 Kwenu nkwa, kwughachi kwa Jehova, bú Chineke-unu: Ka ndi nile ndi nọ Ya buruburu bukue onye ahu di egwu abu.
12 Ọ nēb͕ochi mọ ndi-ndú: Ọ bu onye anātu egwu n'ebe ndi-eze uwa nọ.