Abụ Ọma 86

Jehova, tọ nti-Gi n'ala, zam; N'ihi na onye ewedara n'ala na ob͕eye ka m'bu.
2 Debe nkpuru-obim; n'ihi na onye-ebere ka m'bu: Gi onwe-gi Chinekem, zọputa orù-Gi nke nātukwasi obi na Gi.
3 Merem amara, Onye-nwe-ayi; N'ihi na Gi ka m'nākpọku ogologo ubọchi nile.
4 Me ka nkpuru-obi orù-Gi ṅuria; N'ihi na ọ bu Gi, Onye-nwe-ayi, ka m'nēbuli nkpuru-obim nye.
5 N'ihi na Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, di nma, I bu kwa onye nāb͕aghara nmehie, I nāba kwa uba n'ebere n'aru ndì nile nākpọku Gi.
6 Jehova, ge nti n'ekperem; Ṅa kwa nti n'olu arirọ-amaram nile.
7 N'ubọchi nkpàm m'gākpọku Gi; N'ihi na I gāzam.
8 Ọ dighi onye di ka Gi n'etiti chi nile, Onye-nwe-ayi; Ọ dighi kwa ọlu di ka ọlu-Gi nile.
9 Mba nile ndi I meworo gābia kpọ isí ala n'iru Gi, Onye-nwe-ayi; Ha gāsọpuru kwa aha-Gi.
10 N'ihi na onye uku ka I bu, I nālu kwa oké ọlu di iche iche: Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi.
11 Zim uzọ-Gi Jehova; m'gējeghari n'ezi-okwu-Gi: Me ka obim di n'otù itu egwu aha-Gi.
12 M'gēji obim nile kele Gi, Onye-nwe-ayi, Chineke; M'gāsọpuru kwa aha-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.
13 N'ihi na ebere-Gi di uku n'arum; I siwo n'ala-mọ nke dichasi ala naputa nkpuru-obim.
14 Chineke, ndi-nganga ebiliwo imegidem, Nzukọ ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim, Ha edoghi kwa Gi n'iru ha.
15 Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, bu Chineke Nke nwere obi-ebere, Onye di kwa amara, Nke nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n'ebere na ezi-okwu.
16 Chem iru, me-kwa-ram amara Nye orù-Gi ike-Gi, Zọputa kwa nwa-nwoke nke orù-Gi nwayi.
17 Merem ihe-iriba-ama bayere ezi ihe I gēmerem; Ka ndi nākpọm asì we hu ya, ka ihere we me ha, N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, eyeworom aka, kasikwam obi.