Abù Ọma
Abụ Ọma 112
Tonu Ja.
Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke nātu egwu Jehova.
Nke ihe nile O nyere n'iwu nātọ utọ nke-uku.
2 Ndi-dike ka nkpuru-ya gābu n'uwa:
Agāgọzi ọb͕ọ ndi ziri ezi.
3 Ihe di iche iche di oké ọnu-ahia na àkù di n'ulo-ya:
Ezi omume-ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi.
4 Ihè awaliwo n'ọchichiri nye ndi ziri ezi:
Ọ bu onye-amara, na onye nwere obi-ebere, na onye ezi omume.
5 Ọ diri nwoke ahu nma, bú onye nēme-ebere, nēbinye kwa madu ihe;
Ọ gākwagide okwu-ya nile n'ikpé.
6 N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewezuga ya n'onọdu-ya:
Ihe-ncheta ebighi-ebi ka onye ezi omume gābu.
7 Ọ gaghi-esite n'ihe ọjọ anuworo tu egwu:
Edoziwo obi-ya, ebe ọ nātukwasi Jehova obi.
8 Ihe anākwagide ka obi-ya bu, ọ gaghi-atu egwu,
Rue mb͕e ọ gēlekwasi ndi nākpab͕u ya anya.
9 Ọ ghasawo àkù-ya, o nyewo ndi-ob͕eye ihe;
Ezi omume-ya nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi:
Agēwere nsọpuru me ka mpi-ya di elu.
10 Onye nēmebi iwu gāhu ya, ewe kpasue ya iwe;
Ọ gāta ikekere-ezé, b͕aze kwa:
Ọchichọ ndi nēmebi iwu nāchọsi ike gāla n'iyì.