Abụ Ọma 141

Jehova, akpọkuwom I; biakutem ọsọsọ: Ṅa nti olum, mb͕e m'kpọkuru Gi.
2 Ka edozie ekperem dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Gi; Ka nchili ọbu-akam buru onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi.
3 Jehova, Do nche n'iru ọnum; Chebe ọnu-uzọ eb͕ub͕ere-ọnum abua.
4 Ewezugala obim ime ihe ọjọ, Iji nmebi-iwu nēme omume, Mu na madu ndi nālu ajọ ihe: Ekwe-kwa-la ka m'rie ihe ọ bula nihe-utọ n'ile ha.
5 Ka onye ezi omume tib͕uem, ọ gābu ebere; Ya ba-kwa-ram nba, ọ gābu manu isi; Ekwela ka isim si, É-è: N'ihi na m'nọ nēkpe ekperem imegide ihe ọjọ ha nile.
6 Atudawo ndi-ikpe-ha n'akuku nkume di elu; Ha gānu kwa okwu-ọnum nile; n'ihi na ha di utọ.
7 Dika mb͕e madu nālu ọlu ubi we nēgwuwa ala, Otú a ka esesaworo ọkpukpu-ayi n'ọnu ala-mọ.
8 N'ihi na ọ bu n'ebe I nọ, Jehova, Onye-nwe-ayi, ka anyam abua di: Nime Gi ka m'b͕abàworo; ab͕apula nkpuru-obim dika miri.
9 Debem ka m'ghara idabà n'ib͕udu ha sirim, Na n'ọnyà ndi nālu ajọ ihe.
10 Ka ndi nēmebi iwu dabà n'ub͕u nile nke aka ha n'otù n'otù, Rue mb͕e mu onwem gāgabiga.