Abụ Ọma 78

Ndim, ǹanu nti n'iwum: Tọnu nti n'ala inu okwu nile nke ọnum.
2 M'gāsaghe ọnum n'itu ilu: M'gēkwuwa okwu-omimi di iche iche n'uba, bú nke sitere na mb͕e ochie:
3 Nke ayi nuworo mara kwa, Nke nna-ayi-hà kọwo-kwa-ra ayi.
4 Ayi agaghi-ezonari ha na nti umu-ha, Nākọrọ ọb͕ọ nke gādi n'iru akukọ otuto nile nke Jehova, Na ike-Ya, na oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo.
5 O we me ka otù ihe-àmà guzosie ike nime Jekob, O do-kwa-ra iwu n'Israel, Nke O nyere nna-ayi-hà n'iwu, Ime ka umu-ha mara ha:
6 Ka ọb͕ọ nke gādi n'iru we mara, bú umu agāmu; Ha gēbili, we kọro umu-ha akukọ ahu:
7 Ka ha we tukwasi obi-ha na Chineke, Ghara ichezọ omume nile nke Chineke, Ma debe ihe nile O nyere n'iwu:
8 Ghara kwa idi ka ndi bu nna-ha, Ndi bu ọb͕ọ nēwezuga onwe-ha nke nānupu kwa isi; Ọb͕ọ ndi nēdozighi obi-ha, Ndi mọ-ha nēkwesighi ntukwasi-obi n'ebe Chineke nọ.
9 Umu Efraim, ọ bu ezie na ha nāchi ihe-agha nēbuli kwa uta, Ma ha chighariri n'ubọchi agha.
10 Ha edebeghi ọb͕ub͕a-ndu Chineke, Ma ha juru ijeghari n'iwu-Ya;
11 Ha we chezọ omume-Ya nile, Na oké ọlu-Ya nile nke O mere ka ha hu.
12 N'iru ndi bu nna-ha ka Ọ luru oké ọlu, N'ala Ijipt, n'ọhia Zoan.
13 O kewara oké osimiri, we me ka ha gabiga; O me-kwa-ra ka miri guzo ọtọ dika obo-ihe.
14 O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n'ehihie, Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile.
15 Ọ nākpọwa oké nkume di iche iche n'ọzara, We me ka ha ṅua miri ri nne dika o si nime ob͕u-miri puta.
16 O me-kwa-ra ka miri nke nērù erù si na nkume di elu puta, O we me ka miri nērùda dika ọtutu osimiri.
17 Ma ha nọ nēmehie kwa ọzọ imegide Ya, Inupu isi n'okpuru Onye kachasi ihe nile elu n'ala kpọro nku.
18 Ha we nwa Chineke n'obi-ha N'iriọ ihe-oriri nye ọchichọ-nkpuru-obi-ha.
19 Ha we kwue okwu megide Chineke; Ha siri, Chineke, Ọ̀ puru ido table n'usoro n'ọzara?
20 Le, O tiri oké nkume ihe, miri we nērù erù, Isi-iyi di iche iche nērubiga kwa ókè; Ọ̀ di kwa achicha Ọ puru inye? Ọ̀ gēdoziri ndi-Ya anu?
21 N'ihi nke Jehova nuru, O we webiga iwe ókè: Ewe kponwue ọku megide Jekob, Ọzọ kwa, iwe kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide Israel;
22 N'ihi na ha ekweghi na Chineke, Ha atukwasighi kwa obi-ha na nzọputa-Ya.
23 O we nye mbara-ígwé nile n'elu iwu, Meghe kwa ọnu-uzọ nile nke elu-igwe;
24 O we me ka manna zokwasi ha dika miri, ka ha rie, Ọ bu kwa ọka nke elu-igwe ka O nyere ha.
25 Nri nke ndi di ike ka madu riri: O zitere ha ihe ha gēriju afọ.
26 O nēme ka ifufe Iru-anyanwu bulie ije n'elu-igwe: O ji-kwa-ra ike-Ya duru ifufe Ndida.
27 O we me ka anu zokwasi ha dika ájá, Ọbuná dika ájá oké osimiri, bú anu-ufe nwere nkù:
28 O we me ka ọ da n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-ha, Buruburu ebe-obibi-ha nile.
29 Ha we rie, afọ we ju ha nke-uku; Ọ bu kwa ihe ha nāchọsi ike ka Ọ nēme ka ọ biarue ha aru.
30 Ha abughi ndi ala ọzọ n'ebe ihe ha nāchọsi ike di, Ihe-oriri-ha nādi ha n'ọnu,
31 Mb͕e iwe Chineke kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide ha, We b͕ue ufọdu n'etiti ndi-ha nke mara abuba, Ọ bu kwa umu-okorọbia nke Israel ka o mere ka ha ruru ala.
32 N'ihe a nile ha mehie-kwa-ara ọzọ, Ha ekweghi kwa n'oké ọlu-Ya nile.
33 O we me ka ubọchi nile ha gwusia n'otù nku-ume, O me-kwa-ra ka arọ nile ha gwusia n'obi-ọlulọ-miri.
34 Ọ buru na O b͕uru ha, ha we chọ Ya: Laghachi kwa, chọsie Chineke ike.
35 Ha we cheta na Chineke bu oké nkume-ha, Cheta kwa na Chineke Nke kachasi ihe nile elu bu Onye-nb͕aputa-ha.
36 Ha we ji ọnu-ha nārà Ya, Ji kwa ire-ha nāgwa Ya okwu-ugha.
37 Obi-ha eguzosighi kwa ike n'ebe Ọ nọ, Ha ekwesighi kwa ntukwasi-obi n'ọb͕ub͕a-ndu-Ya.
38 Ma Ya onwe-ya, ebe O nwere obi-ebere, Ọ nēkpuchi ajọ omume-ha, Ọ dighi-ebibi kwa ha: E, ọtutu mb͕e ka O mere iwe-Ya ka ọ laghachi azu, Ọ dighi-akpọte kwa ọnuma-Ya nile.
39 O we cheta na anu-aru ka ha bu; Ifufe nke nālafe alafe, we ghara ilaghachi.
40 Ùb͕ò ole ka ha nānupu isi n'okpuru Ya n'ọzara? Ùb͕ò ole ka ha nēme ka o wuta Ya n'ala tọb͕ọrọ n'efu?
41 Ha we chigharia, we nwa Chineke, Ọ bu kwa Onye nsọ nke Israel ka ha kpasuru iwe.
42 Ha echetaghi aka-Ya, Ubọchi mb͕e Ọ b͕aputara ha n'aka onye-nkpab͕u.
43 Otú O tiyere ihe-iriba-ama-Ya nile n'Ijipt, Tiye kwa ihe-ebube-Ya nile n'ọhia Zoan;
44 O we b͕anwe osimiri Nail nile ha ka ha ghọ ọbara, Ha adighi-aṅu kwa miri-ha nērù erù.
45 Ọ nēzite odudu n'etiti ha, nke nātab͕u ha; Ọ nēzite kwa awo, nke nēbibi ha.
46 Ọ nye-kwa-ra ọbubu ihe-omume-ha, Nye kwa igurube ihe ha dọb͕uru onwe-ha n'ọlu inweta.
47 O nēji ákú-miri-ígwé b͕u osisi vine nile ha, Ji kwa frost b͕u osisi sycomore nile ha.
48 O mechibido-kwa-ra anumanu-ha nye ákú-miri-ígwé, Mechibido kwa anu-ulo nile ha nye àmùmà di ọku.
49 Ọ nēzite ọnuma nke iwe-Ya n'etiti ha, Nrubiga-ókè-iwe, na iwe, na nkpab͕u, Bú ozìzì nke ndi-mọ-ozi nke ihe ọjọ.
50 Ọ nēme ka uzọ di lari bayere iwe-Ya; O b͕ochighi nkpuru-obi-ha n'inwu ọnwu, Kama O mechibidoro ndu-ha nye ajọ ọria nēfe efe;
51 O we tib͕ue nwa ọ bula eburu uzọ mu n'Ijipt, Bú nkpuru mbu nke ume-ha n'ulo-ikwū nile nke Ham:
52 O we me ka ndi-Ya bulie ije dika ìgwè ewu na aturu, Ọ nēdu kwa ha n'ozara dika ìgwè aturu.
53 O we nēdu ha n'ikwesi-ntukwasi-obi, ha atughi kwa oké egwu: Ma ndi-iro-ha, oké osimiri kpuchiri ha.
54 O we me ka ha biarue ókè-ala nsọ Ya, Rue ugwu a nke aka-nri-Ya nwetara.
55 Ọ chupu-kwa-ra mba nile n'iru ha, We me ka ala ha barue ndi ya aka n'ala nketa e ji údò tua, O we me ka ebo nile nke Israel biri n'ulo-ikwū-ha.
56 Ma ha nwara Chineke Nke kachasi ihe nile elu, ha we nupu isi n'okpuru Ya, Ha edebeghi kwa ihe-àmà-Ya nile;
57 Kama ha laghachiri azu, we ghọb͕ue nghọb͕u dika ndi bu nna-ha: Ha riri mpe dika uta nāghọ aghughọ.
58 Ha we were ebe nile ha di elu kpasue Ya iwe, Were kwa arusi nile ha apiri api me ka O kwo ekworo.
59 Chineke nuru nka, O we webiga iwe ókè, Jusie Israel ike:
60 O we rapu ebe-obibi nke Shailo, Bú ulo-ikwū nke O mere ka o biri n'etiti madu;
61 O we were ike-Ya nye ka adọta ya n'agha, Were kwa ima-nma-Ya nye n'aka onye-nkpab͕u.
62 O mechibido-kwa-ra ndi-Ya nye n'aka mma-agha; Ọ bu kwa ihe-nketa-Ya ka O webigara iwe-ókè megide.
63 Ọku ripiara umu-okorọbia-ha; Etoghi kwa umu-ab͕ọghọ-ha nāmaghi nwoke n'abù ọlulu-di.
64 Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha; Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá.
65 Onye-nwe-ayi we teta dika onye nāraru ura, Dika dike nke nēti nkpu nke-uku site na manya-vine.
66 O we tib͕ue ndi-nkpab͕u-Ya n'azu: Ita-uta ebighi-ebi ka O nyere ha.
67 Ọzọ, Ọ juru ulo-ikwū nke Josef, Ọ bughi kwa ebo Efraim ka Ọ rọputara;
68 Kama Ọ rọputara ebo Juda, Rọputa ugwu Zaion, nke Ọ huru n'anya.
69 O we wue ebe nsọ Ya dika ebe di elu, Dika uwa nke Ọ tọrọ ntọ-ala-ya rue mb͕e ebighi-ebi.
70 Ọ rọputa-kwa-ara Devid, bú orù-Ya, O we si n'ogige ìgwè ewu na aturu kuru ya:
71 O mere ka o si n'iso nne-aturu nke nēnye umu-ha ara bia, Izù Jekob, bú ndi-Ya, na Israel, bú ihe-nketa-Ya, dika aturu.
72 O we nāzù ha dika izu-okè nke obi-ya si di; Were kwa ihe-nghọta nile nke ọbu-aka-ya abua nēdu ha.