Abù Ọma
Abụ Ọma 132
Jehova, chetara Devid
Nweda-n'ala-ya nile.
2 Otú ọ ṅuru Jehova iyi,
Kwe Dike nke Jekob nkwa:
3 N'ezie m'gaghi-abà n'ulo-ikwū nke ulom,
M'gaghi-arigo n'elu ihe-ndina nke utem;
4 M'gaghi-enye anyam abua ura,
M'gaghi-enye mbubere-anyam irù-ura;
5 Rue mb͕e m'gāchọtara Jehova ọnọdu,
Chọtara Dike nke Jekob ebe-obibi.
6 Le, ayi nuru okwu bayere ya n'Efrata:
Ayi chọtara ya n'ọhia nke oké ọhia.
7 Ka ayi ba n'ebe-obibi-Ya nile;
Ka ayi kpọ isi ala n'ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di.
8 Bilie, Jehova, ba n'ebe-izu-ike-Gi;
Gi onwe-gi, na ib͕e nke ike-Gi.
9 Ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri ezi omume dika uwe;
Ka ndi-ebere-Gi tikwa nkpu ọnu.
10 N'ihi Devid, bú orù-Gi,
Atugharila iru onye-Gi etere manu.
11 Jehova aṅuworo Devid iyi bu ezi-okwu;
Ọ gaghi-esi na ya laghachi azu:
Ndi sitere na nkpuru nke afọ-gi ka M'gādọkwasi n'oche-eze i nwere.
12 Ọ buru na umu-gi edebe ọb͕ub͕a-ndum
Na ihe-àmàm nke M'gēzí ha,
Umu-ha gānọkwasi kwa n'oche-eze i nwere rue mb͕e nile ebighi-ebi.
13 N'ihi na Jehova arọputawo Zaion;
Ọ chọsiwo ya ike iburu Ya ebe-obibi.
14 Nka bu ebe-izu-ikem rue mb͕e nile ebighi-ebi:
N'ebe a ka M'gēbi; n'ihi na achọsiwom ya ike.
15 Ihe-oriri-ya ka M'gāgọzi nke-uku:
Ndi-ob͕eye-ya bu ndi M'gēji nri me ka afọ ju ha.
16 Ọ bu kwa ndi-nchu-àjà-ya ka M'gēyikwasi nzọputa dika uwe:
Ndi-ebere-ya gētisi kwa nkpu ọṅù ike.
17 N'ebe ahu ka M'gēme ka mpi Devid nwere pue:
Edoworom onye nkem etere manu oriọna n'usoro.
18 Ndi-iro-ya ka M'gēyikwasi ihere dika uwe:
Ma n'isi-ya ka okpu-eze-ya gāb͕awa okoko.