Abụ Ọma 72

Chineke, nye eze ikpé-Gi nile, Nye kwa nwa eze ezi omume-Gi.
2 O gēji ezi omume kpe ndi-Gi ikpe, O gēji kwa ikpe ziri ezi kpe ndi-Gi ewedara n'ala.
3 Ugwu nile gēbutere ndi-Gi udo, Ugwu ntà kwa, n'ezi omume.
4 Ọ gēkpe ndi ewedara n'ala n'etiti ndi-Gi ikpe, Ọ gēnye umu nke ob͕eye nzọputa, Zọpia kwa onye-nmeb͕u.
5 Ha ganātu egwu Gi ogologo mb͕e anyanwu gādigide, Na n'iru ọnwa, rue ọb͕ọ nile.
6 Ọ gārida dika miri-ozuzo si ezokwasi n'ọzara asuru asu: Dika oké miri-ozuzo nke nēdè ala.
7 Onye ezi omume gāma akwukwọ n'ubọchi nile ya dika osisi ndu; Ọtutu udo gādi kwa rue mb͕e ọnwa agaghi-adi.
8 Ya nwe kwa ike n'aru madu site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, Site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.
9 Ndi bi n'ala kpọrọ nku gēruru ala n'iru ya; Ọzọ, ndi-iro-ya gāracha ájá.
10 Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma: Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso.
11 E, eze nile gākpọ isi ala nye ya: Mba nile gēfè ya òfùfè.
12 N'ihi na ọ gānaputa ob͕eye mb͕e o nētiku ya; Ọ gānaputa kwa onye ewedara n'ala mb͕e ọ dighi onye nēyere ya aka.
13 Ọ gēmere onye nēnweghi ike na ob͕eye ebere, Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-ob͕eye ka ọ gāzọputa.
14 Ọ gēsi n'aka nzọb͕u na n'aka ime-ihe-ike b͕aputa nkpuru-obi-ha; Ọbara-ha gādi kwa oké ọnu-ahia n'anya-ya.
15 Ya di kwa ndu! agēnye kwa ya ufọdu n'ọla-edo Sheba: Agēkpe kwa ekpere bayere ya mb͕e nile; Ogologo ubọchi nile ka agāgọzi ya.
16 Ka ọtutu ọka di n'ala n'elu ugwu nile; Nkpuru-ya ganēme nkpatu dika Lebanon: Madu gēsi kwa n'obodo wa okoko-osisi dika ihe akuru n'ala.
17 Ka aha-Ya dirue mb͕e ebighi-ebi; N'iru anyanwu ka aha-Ya gāmu ọmùmù: Madu gāgọzi kwa onwe-ha nime ya: Mba nile gākpọ ya onye ihe nāgara nke-ọma.
18 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke, bu, bú Chineke nke Israel, Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche:
19 Ihe agọziri agọzi ka aha nsọpuru Ya bu kwa rue mb͕e ebighi-ebi; Ka uwa nile juputa kwa na nsọpuru-Ya. Amen, na Amen.
20 Ekpere nke Devid nwa Jesi agwuwo.