Abụ Ọma 126

Mb͕e Jehova mere ka ndi nālata na Zaion lata, Ayi di ka ndi nārọ nrọ.
2 Mb͕e ahu ọchì nēju ayi ọnu, Iti-nkpu-ọṅù nēju kwa ayi ire: Mb͕e ahu ha nāsi n'etiti mba nile, Jehova emeworo ndia ihe uku.
3 Jehova emeworo ayi ihe uku; Ayi nāṅuri ọṅu.
4 Jehova, me ka ndi-ayi adọtara n'agha lata, Dika miri-iyi di iche iche nime Negeb.
5 Ndi ji anya-miri agha nkpuru gēji iti-nkpu-ọṅù we ihe-ubi.
6 Onye nēbu nju-aka nkpuru-ọghigha, ọ bu ezie na ọ nēje ije nākwa ákwá; Ma ọ ghaghi iwere iti-nkpu-ọṅù biaghachi, nēbu ùkwù-ọka-ya nile.