Abù Ọma
Abụ Ọma 56
Merem amara, Chineke; n'ihi na madu ekusiwo ume ike ilom:
Ogologo ubọchi nile ka o nēbu agha nēmeb͕um.
2 Ndi nēchem anwu nēkusi ume ike ilom ogologo ubọchi nile:
N'ihi na ha bara uba bú ndi nēbu agha imegidem n'ibuli onwe-ha elu.
3 N'ubọchi m'nātu egwu,
Mu onwem, ọ bu Gi ka m'gātukwasi obi.
4 Nime Chineke ka m'gēto okwu-Ya:
Ọ bu Chineke ka m'tukwasiworo obi, m'gaghi-atu egwu;
Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem?
5 Ogologo ubọchi nile ka ha nāhighari okwum nile:
N'imegidem èchìchè nile ha bu ime ihe ọjọ.
6 Ha nēzukọ, nēzobe onwe-ha,
Ndi ahu nēlezi ikiri-ukwum abua anya,
Dika ha leworo anya nkpuru-obim.
7 Ọ̀ bu n'ihi ajọ ihe ka ha nāb͕apu?
N'iwu-Gi me ka ndi nile di iche iche rida, Chineke.
8 Nwagharim ka Gi onwe-gi guworo ọnu:
Tiye anya-mirim nile nime karama-akpukpọ-Gi;
Hà adighi n'akwukwọ-Gi:
9 Mb͕e ahu ndi-irom gālaghachi azu n'ubọchi m'gākpọku Gi:
Nka ka m'mara, na Chineke dirim.
10 Nime Chineke ka m'gēto okwu-Ya:
Nime Jehova ka m'gēto okwu-Ya.
11 Ọ bu Chineke ka m'tukwasiworo obi, m'gaghi-atu egwu;
Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem?
12 N'isim, Chineke, ka nkwa nile m'kwere Gi di:
M'gākwughachi Gi ekele nile.
13 N'ihi na I naputawo nkpuru-obim n'ọnwu:
Ì naputaghi ukwum abua na nnuda anēnudam?
Ka m'we nējeghari n'iru Chineke
N'ihè ndi ndu.