Abụ Ọma 49

Nurunu nka, ndi nile di iche iche; Ṅanu nti, ndi nile bi n'uwa nka:
2 Ma ndi di ala ma ndi di elu, Ọgaranya na ob͕eye n'otù.
3 Ọnum gēkwu okwu amam-ihe nile; Ntughari-uche nke obim gābu kwa nghọta nile.
4 M'gātọ ntim n'ala n'ilu: M'gēkpughepu okwu-omimim n'ubọ-akwara.
5 N'ìhi gini ka m'gātu egwu n'ubọchi ihe ọjọ, Mb͕e ajọ omume nke ndi nējidem n'ikiri-ukwu dim buruburu,
6 Bú ndi nātukwasi obi n'àkù-ha, Nānya kwa isi n'iba-uba nke ọgaranya ha bu?
7 Ọ dighi onye ọ bula gāb͕aputa nwa-nne-ya ma-ọli, Ọ gaghi-enye Chineke ihe-nb͕aputa-ya:
8 (N'ihi na nb͕aputa nkpuru-obi-ha di oké ọnu-ahia, Ọ gāra kwa ya aka rue mb͕e ebighi-ebi:)
9 Ka o we digide ndu rue mb͕e ebighi-ebi, Ghara ihu nbibi anya.
10 N'ihi na ọ gāhu ya: ndi-amam-ihe gānwu, N'otù ka onye-nzuzu na onye bu anu-ọhia nālakọ n'iyì, We rapuru ndi ọzọ àkù-ha.
11 Èchìchè-obi-ha bu, na ulo-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi, Ebe-obibi-ha rue ọb͕ọ nile; Ha ewerewo aha-ha kpọkwasi ala nile ha.
12 Ma madu adighi-anọgide na nsọpuru: O yiri anu nke emeworo ka ha debe ọnu-ha du n'ọnwu.
13 Uzọ-ha nka buru ha nzuzu: Ma mb͕e ha gasiri okwu-ọnu-ha nātọ madu utọ. Selah
14 Dika ìgwè ewu na aturu, ọ bu ala-mọ ka edoworo ha nye; Ọnwu gābu onye nāzù ha dika aturu: Ndi ziri ezi gēnwe ike n'aru ha n'ututu; Udi-ha bu ihe ala-mọ gēme ka ọ ka nká, ka ebe-obibi ghara idiri ya.
15 Otú ọ di, Chineke gāb͕aputa nkpuru-obim n'aka ala-mọ: N'ihi na Ọ gēkurum la. Selah
16 Atula egwu mb͕e madu nēme ọgaranya, Mb͕e nsọpuru nke ulo-ya nāba uba:
17 N'ihi na mb͕e ọ nwuru ọ gaghi-ewere ihe ahu nile la; Nsọpuru-ya agaghi-arida so ya.
18 N'ihi na mb͕e ọ di ndu ọ nāgọzi nkpuru-obi-ya, Madu nēkele kwa gi mb͕e i nēmere onwe-gi ezi ihe.
19 Ọ gābakuru ọb͕ọ nna-ya-hà; Rue mb͕e ebighi-ebi ha agaghi-ahu ìhè.
20 Madu nke nọ na nsọpuru, ma ọ dighi-aghọta ihe, Yiri anu emeworo ka ha debe ọnu-ha du n'ọnwu.