Abụ Ọma 65

Gi ka otuto nēdere du, Chineke, nime Zaion: Ọ bu kwa Gi ka anākwughachi nkwa ekwere.
2 Gi Onye nānu ekpere, Gi ka anu-aru nile, bú madu, gābiakute.
3 Okwu nile nke ajọ omume nile dikaririm ike: Njehie nile ayi, Gi onwe-gi gēkpuchi ha.
4 Ihe nāgara ya nke-ọma, bú onye I nārọputa, Onye I nēme kwa ka ọ biarue nso, Ka o we biri n'ogige-Gi nile: Ka afọ ju ayi n'ezi ihe nke ulo-Gi, Bú ebe nsọ nke ulo uku Gi.
5 Ihe di egwu ka I nēji za ayi n'ezi omume, Chineke nke nzọputa-ayi; Gi Onye bu ihe-ntukwasi-obi nke nsọtu nile nke uwa, Na nke oké osimiri, bú ebe di iche iche di anya:
6 Onye nēji ike-Ya me ka ugwu nile guzosie ike; Ebe ewerewo idi-ike ke Ya n'úkwù:
7 Onye nēme ka nkpọtu oké osimiri dajua, bú nkpọtu nmali-miri-ha, Ya na ùzù nke mba nile.
8 Ndi bi na nsọtu nile nke uwa we nātu egwu ihe-iriba-ama nile gi: I nēme ka ọpupu nile nke ututu na anyasi tie nkpu ọǹù.
9 I letawo ala, we me ka o juputa n'ihe, I nēme ka ọ nwe àkù ri nne; Miri-iyi Chineke juputara na miri I nēdozi ọka-ha, mb͕e I si otú a dozie ala onwe-ya.
10 I nēdè ọ̀b͕à-ala-ubi-ya miri: I nēme ka ebe elu ya nile di lari: I nēji oké miri-ozuzo b͕aze ya; I nāgọzi ihe-opupú-ya.
11 I kpubewo arọ nke ezi ihe-Gi okpu-eze; Uzọ-Gi nile nātasasi kwa abuba.
12 Ha nātasa n'ebe-ita-nri niile nke ọzara: Anēji kwa otite-egwú-ọṅù ke ugwu ntà nile n'úkwù.
13 Ewerewo igwè ewu na aturu yikwasi ebe-ita-nri nile dika uwe; Anēwere ọka kpuchie ndagwurugwu nile; Ha nēti nkpu ọǹù, e, ha nābù abù.