Abụ Ọma 64

Chineke, nuru olum n'itughari-uchem:Nēchezi ndum ka ọ pua n'oké egwu nke onye-iro.
2 I gēzopum n'ìzù nzuzo nke ndi nēme ihe ọjọ:N'ìgwè ndi nālu ajọ ihe:
3 Ndi muworo ire-ha dika mma-agha,Ha edowo àkú-ha, bú okwu di ilu:
4 Ib͕a onye zuru okè àkú n'ebe nzuzo di iche iche:Na mberede ka ha nāb͕a ya, ha adighi-atu kwa egwu.
5 Ha nēme okwu ọjọ ka ọ diri ha ike;Ha nākọ akukọ bayere isi ọnyà na nzuzo;Ha siri, Ònye gāhu ha?
6 Ha nāchọputa ajọ omume nile, si, Ayi emezuwo nchọputa achọputara nke-ọma:Ọzọ, èchìchè-ime nke madu ọ bula nime ha na obi-ya miri emi.
7 Ma Chineke nāb͕a ha àkú;Na mberede ka ntib͕u nile ha bu.
8 Ewe me ka ha su ngọngọ, ebe ire nke aka ha nēmegide ha:Ha nēfufe isi, bú onye ọ bula nke nēlekwasi ha anya.
9 Madu nile gātu kwa egwu;We gosi ọlu Chineke,Were uche chè èchìchè bayere omume-Ya.
10 Onye ezi omume gāṅuri na Jehova, b͕abà kwa nime Ya;Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gānya kwa isi.